Third Term Agenda: Falana sị na ihe niile ya hụrụ na-arụtụ aka na ọ bụ ebe Buhari na-aga

Ọkaiwu Femi Falana ekwuola na a na-akpa nkata ka Muhammadu Buhari lọghachite azụ dịka onyeisiala Naịjirịa nke ugboro atọ.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ekwentị nke ya na BBC nwere n'ehihie Satọdee.
Falana kọwara na ndị ọchịchị maliteburu atụmatụ ahụ ma mechaa wụsatụ ọwa n'ihi na ha ma na ụmụ Naịjirịa agaghị achọ iji ntị anụ ya.
Mana o kwuru na ihe niile na-eme ugbua na-arụtụ aka na ya bụ atụmatụ 'third term' ka na-aga n'ihu.
Gịnị kpatara Falana ji kwuo nke a?

Ebe foto si, Femi Falana's Facebook page
Falana kọwara na ọtụtụ ndị ọchịchị na mba Afrịka ndị ọzọ amalitela atụmatụ dị icheiche iji hụ na ha agaghị aritu n'ọchịchị.
Mana Naịjirịa bụ mba kachasị n'Afrịka gbachịrị nkịtị mee ka ha anaghị ahụ ihe na-eme.
Mba ndị a gunyere Bene Repọblik, Togo, Gini, Aịvrị Kost, dgz.

Ebe foto si, Twitter/@BashirAhmad
Ọzọkwa, Falana gụpụtara ihe ndị ọ sị ndị mmadụ ga-eji mata na atụmatụ 'third term' na-aga n'ihu.
Ha gunyere:
- Mgbe ndị ọchịchị malitere ịkpachị ụlọọrụ ntaakụkọ.
- Mgbe ndị ọchị malitere imekpa ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ ahụ iji mee ka otu nke ha bụrụ naanị eze ga-akwụ ọtọ.
- Mgbe ndị ọchịchị malitere ịkpọpụ ndị ntaakụkọ ụlọikpe, na-ebo ha ebubo ụgha dị icheiche.
- Mgbe ndị ọchịchị machiri ndị mmadụ ime ngagharịiwe udo.
- Mgbe ndị ọchị malitere ịtọhapụ ndị ekperima na ndị omekome, ma na-anwụchi ndị enweghị ihe ha mere.
- Mgbe ndị ọchịchị malitere kwuwe na ha agahị asọpụrụ mkpebi ndị ụlọikpe.
- Mgbe ndị ọchịchị malitere ikwu na nchekwa obodo ka mkpa karịa irube isi n'iwu nke ụlọikpe nyere.
Falana kwuru na ihe ndị a abụghị na nkịtị.
O kwuru na ha bụ iji mee ka ụjọ baa onye ọbụla ahụ nke ga-eme na onweghị onye ụjọ ga-ekwe kwuo okwu mgbe ya bụ atụmatụ 'third term' malitere n'uju.
Gbasara Sowor
Falana kwuru na onweghị ihe ọbụla gọọmentị ji aka mere ha ji nwụchie Omoyele Sowore.
Ọ kọwara na ihe ha chọrọ bụ ka ha mechie ụlọntaakụkọ 'Sahara Reporters' nke Sowore bụ onyeisi ya.
Dịka Falana si kọwaa, 'Sahara Reporters' so na ndị mere ka atụmatụ 'third term' nke Olusegun Obasanjo kụọ afọ n'ala.
Ihe ụlọọrụ onyeisiala kwuru
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
O nwebeghi ihe ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru maka okwu a Falana kwuru n'ụbọchị Satọdee.
Mana Buhari ekwubuola na onweghị mgbe ọbụla o ji buru n'uche ịzọ ọchịchị nke ugboro atọ.
Ọnụ na-ekwuru ya bụ Garba Shehu kwuru nke a n'abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba bụ ụbọchị ncheta nnwereonwe Naịjirịa n'aka ndị mba Briten.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:































