Under-23 Nations Cup: Ụmụ Naịjirịa ji ọnyụpa malite iko mba Afrịka

Under 23 Eagles

Ebe foto si, Twitter/NFF

Nkọwa foto, Ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa ndị 'under 23'

Aka wụrụ ụmụ Naịjirịa ndị 'under 23' n'isi taa.

Ọnyụpa ka ha ji malite asọmpi iko mba Afrịka maka ndị na-akarịghị afọ iri abụọ na atọ.

Ọbụkwa asọmpi a ka a ga-eji họta ndị ga-aga egwuregwu 'Olympics' nke afọ 2020.

Ha na ndị Ivory Coast zutere onwe ha taa n'egwuregwu mbụ ha na ya bụ asọmpi.

Mana ha agbataghị ọnụ ha n'ihi na Ivory Coast ji otu ọkpụ goolu kọwaara ha ihe ọkụ ji ntị oke eme.

Penariti ka Silas Gnaka ji gbakaa neetị na nkeji 71 n'egwuregwu ahụ.

Nigeria U23 vs Ivory Coast U23

Ebe foto si, Google

Ọbụ Olisa Ndah gbaturu mmadụ n'ihu goolu nke mere e ji nye ya akwụkwọ ọbara ọbara ma gbaara ya ụgbọnwamkpi.

Naịjirịa nọ n'otu 'B' n'asompi ahụ.

Ndị ọzọ nọ'notu ahụ gụnyere Ivory Coast, Saut Afrịka, na Zambịa.

Buharị na-arọ 'third term' anya

Femi Falana

Ebe foto si, Femi Falana's Facebook page

Nkọwa foto, Femi Falana

Okaiwu e ji nkwalite ikike dịịrị onye mara bụ Femi Falana ekwuola na ọ na-adị ya ka onyeisiala Buharị ọ na-akpa nkata ịchị Naịjirịa nke ugboro atọ.

Falana gwara BBC na mmekpa ahụ niile a gọọmentị etiti na-emekpa ndị ntaakụkọ bụ iji mee ka ụjọ ghara ikwe ha kwuo ihe ọbụla mgbe ha ga-amalite atụmatụ 'third term' ha bu n'obi.

Ndị Dọkịta Zimbabwe

Doctors protest in Zimbabwe
Nkọwa foto, Ndị dọkịta na-eme ngagharịiwe na Zimbabwe

Mba Zimbabwe achụọla ndị dibia bekee ruru narị abụọ n'ọrụ n'ihi ngagharịiwe ha na-eme iji kwuo ka e bulie ụgwọọnwa ha.

Gọọmentị Zimbabwe kwuru na ha enweghị ego ọbụla iji buliere ndị dọkịta ụgwọọnwa.

Ndị dọkịta na-ewe iwe na ego a na-akwụ ha enweghị ihe ọbụla ọ na-ezuru ha.

Nke a bụ maka oke ihe isi ike dị na Zimbabwe ugbua.

Ihe a na-akwụ ndị dọkịta zimbabwe ugbua erughi otu narị dọla.

Gwomgworo dara n'Ọka

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Oruola tanka anọ dara n'Anambara n'ime izuụka anọ

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara bụ Haruna Mohammed sị na gwomgworo bu mmanụ ụgbọala dara n'ụzọ Zik dị n'Ọka bụ isi obodo Anambara steeti n'elekere asaa nke ụtụtụ taa.

Maazi Mohammed sị na ndị ọrụ ha nakwa ndị ọrụ gbata gnata ntịnyụ ọkụ nọ n'ogige ihe a mere.

"Anyị na-agba mbọ ịhụ na ndị mmadụ abanyeghi iku mmanụ a, ma hụ kwa na onweghị ihe mberede ọbụla si n'ihe mere pụta.

Nke a na-eme ihe ruru gwomgworo anọ dara n'Anambara n'ime izuụka anọ.

Gwomgworo dara n'Ọka

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Iwu ọhụrụ Gọvanọ Willie Obiano hibere kwesiri ịkụsị Gwomgworo ịgba n'ehihe n'Anambara

Nke mbọ batara n'akụkọ BBC Igbo bụ nke butere ọkụ ọgbụgba ahaịa Ọchanja.

Gọọmentị Anambara ji maka oke ọdụda gwomgworo a manye iwu ka ha gharị ịgba n'ehihe.

Ọchịchịrị gbara n'ọtụtụ ebe na Naịjirịa

Ọkụ ukpe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ebe n'ala Igbo enweghi ọkụ afọ ruo afọ

Nwanne i nwere ọkụ latrik n'ogbe gị? Ọ bụrụ na i nweghi ọkụ mara na ọ bụ n'ihi nsogbu igwe ọkụ nwere na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.

Akụkọ na-ekwu na steetị ndị nke a metụtara gụnyere Legọs, Abuja, Kano nakwa ọtụtụ ebe ndị ọzọ.

N'ofesi

Ụlọikpe ukwu dị na Delhi chabiri ikpe a

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe kachasị na mba India a chabiela ikpe sị ka e were ala nsọ a kpọrọ Ayodhya dị na mpaghara ugwu India nye ndị okpukperechi Hindu.

Ndị okpukperechi Hindu na ndị Alakụba na-azọ oke ala nsọ kamgbe ọtụtụ iri afọ gara aga.

Aworan Sowore

Ebe foto si, Omoyele Sowore

Nkọwa foto, Adajọ ti tu Soworẹ silẹ

Ụlọọrụ nchekwa DSS sị n'ezie na ha anatala iwu sị ka ha tọhapụ Omoyele Sowore kama na o nwebeghi onye bịara ịkpọrọ ya.

Nke a dị n'ime akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya wepụtara n'ụbọchị bụ abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba, 2019.

Ọ sị na ha agwala ụlọikpe nyere iwu a na-onwebeghi onye bịara sị na ọ chọrọ ịkpapụta Sowore.

Afunanya gara n'ihu kwuo na ụlọọrụ ha abụghị nke na-enupuisi n'iwu ụlọikpe nyere.

Mana ọkaiwu Sowore bụ Femi Falana gwara BBC nwanne ụnyaahụ na o zipụla ndị ọrụ njem ịkpọlata nwa amadị ahụ.

Falana kwukwara na ya ga-agba DSS akwụkwọ maka ha emeghị ihe ụlọikpe sị ha mee.

Ego e ji arụ ụzọ dị obere - Ụlọomeiwu nta

Ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, Facebook/Nigerian HoR

Nkọwa foto, Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari

Kọmiti ụlọomeiwu nta na-ahụ maka okporoụzọ sị na ijeri naịra iri abụọ na itoolu amawapụtara maka ịrụzi ụzọ agaghị ezu n'ihi ọnọdụ ọjọọ okporoụzọ Naịjirịa dị.

N'otu aka ahụ, pati anọghị n'ọchịchị bụ PDP sị ka mịnịsta na-ahụ maka ọrụụzọ bụ Babatunde Fashola rịtuo n'ọkwa n'ihi okwu ha si na o kwuru maka ọnọdị okporoụzọ.

N'ofesi

Luiz Inácio Lula da Silva

Ebe foto si, AFP

A tọhapụla onye bụbu onyeisiala mba Brazil bụ Luiz Inacio Lula da Silva dịka ọ nọchara ihe karịrị ọnwa iri na asatọ n'ụlọ mkpọrọ.

A tụrụ Lula mkpọrọ n'obodo Curitiba n'ihi ebubo nrụrụaka.

Ọkaikpe sị ka a tọhapụ ya ma nye ya ohere ị gaa n'ụlọikpe mkpegharị ga zara ọnụ ya.

Chelsea apịawaala Crystal Palace azụ

Chelsea 2-0 Crystal Palace

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tammy Abraham nyetaara Chelsea goolu.

Ndị otu egwu bọọlụ Chelsea na-achakezi ka kpakpando ugbua.

Goolu abụọ asataghị asata ka ha ji pịawaa ndị Crystal Palace azụ na mgbede Satọdee.

Tammy Abraham na Christian Pulisic bụ ndị nyere Chelsea mmeri.

Frank Lampard

Ebe foto si, Chelsea FC

Nkọwa foto, Frank Lampard bụ onye nkuzi bọọlụ bụ ọkaibe n'ọnwa Ọktoba

Chelsea emeriela asọmpi isii ikpeazụ ha gbarala.

Nke a mere ka e tunye onye nkuzi ha bụ Frank Lampard ugo dịka ọkaibe n'ọnwa October.

Bayern chọrọ ịzụ Arsene Wenger

Arsene Wenger

Ebe foto si, Getty Images

Onye nchịkọta Arsenal n'oge mbụ bụ Arsene Wenger na otu egwuregwu Bayern Munich ga-enwe mkparịta ụka n'izuụka ọzọ maka iwere ọnọdụ dịka onye nchịkọta ha.

Cheta na Bayern Munich chụpụrụ Niko Kovac onye jibu ọkwa onye nchịkọta ha n'izu a.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, 'Agaghị m agbatịnwu aka m mana a ga m agbatịnwu ụbụrụ m'