Ncheta Ọbịbịa Eri: Mmemme a ebirila ọkụ n'Aguleri ugbua
Nkọwa foto, Eze Chukwuemeka EriMgbe e biputara ya
Taa ka ndị obodo Aguleri na eme emume ncheta ọbịbịa Eri.
Nke a bụ nnukwu emume, ọbụghị sọ n'Aguleri kama n'ala Igbo niile gbaa gburubguru.
Dịka akụkọ sị kọọ, Eri bụ nna ndị Igbo niile.
N'ihi nke a ka ndị Igbo niile ji akwanyere emume ncheta ọbịbịa Eri nnukwu ugwu.
BBC Igbo kwụ chịm na ya bụ emume wee na-ewetara gị etu ihe niile sị aga.
Nkọwa foto, Ihe ọkpụkpụ na-egosi Eri onye ụfọdụ sị na ọbụ ya bụ nna ndị Igbo niileNkọwa foto, Ndị eze si ebe dị icheiche n'ala Igbo gbara ụkwụ n'Aguleri taaNkọwa foto, Igwe Nnaeme Achebe, Obi nke Ọnịcha nọkwa ebe ahụ, ya na onye enyemaka yaNkọwa foto, Onye na-anọchite anya Ooni nke Ife dị n'ala YorobaNkọwa foto, Ndi ichie ndị Aguleri nọkwa ya n'ozuzu okeNkọwa foto, Anaghị achọ ụmụnwanyị achọNkọwa foto, Ọtụtụ ụmụnwanyị isi ojii mba Amerịka bịakwara ya bụ emumeAkụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Aha onyonyo, Ihe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria