Ncheta Ọbịbịa Eri: Mmemme a ebirila ọkụ n'Aguleri ugbua

Eze Chukwuemeka Eri
Nkọwa foto, Eze Chukwuemeka Eri

Taa ka ndị obodo Aguleri na eme emume ncheta ọbịbịa Eri.

Nke a bụ nnukwu emume, ọbụghị sọ n'Aguleri kama n'ala Igbo niile gbaa gburubguru.

Dịka akụkọ sị kọọ, Eri bụ nna ndị Igbo niile.

N'ihi nke a ka ndị Igbo niile ji akwanyere emume ncheta ọbịbịa Eri nnukwu ugwu.

BBC Igbo kwụ chịm na ya bụ emume wee na-ewetara gị etu ihe niile sị aga.

Lee ya na foto ndịa:

A sculptor of Eri
Nkọwa foto, Ihe ọkpụkpụ na-egosi Eri onye ụfọdụ sị na ọbụ ya bụ nna ndị Igbo niile
Ndị eze
Nkọwa foto, Ndị eze si ebe dị icheiche n'ala Igbo gbara ụkwụ n'Aguleri taa
Obi of Onitsha, Alfred Nnaemeka Achebe and his aide
Nkọwa foto, Igwe Nnaeme Achebe, Obi nke Ọnịcha nọkwa ebe ahụ, ya na onye enyemaka ya
Representative of the Ooni of Ife
Nkọwa foto, Onye na-anọchite anya Ooni nke Ife dị n'ala Yoroba
Aguleri Chiefs
Nkọwa foto, Ndi ichie ndị Aguleri nọkwa ya n'ozuzu oke
Aguleri Women
Nkọwa foto, Anaghị achọ ụmụnwanyị achọ
African American women
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụnwanyị isi ojii mba Amerịka bịakwara ya bụ emume

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria