'Onye anwakwala anwa kpọọ m onye Yoruba ọzọ'- FFK

fani kayode

Ebe foto si, @Femi Fani Kayode

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye bụbu minista na ahụ maka njem ụgbọelu bụ Femi Fani Kayode akwọọla aka Pontus Pirate n'isi aha ndị Yoruba.

Nwaamdị ahụ eji FFK mara sị na ọ bụ ndị Fulani nyere ha aha ahụ, nke ha kpọrọ Yariba n'olu ha.

Ọ sị na ndị Fulani ji ya bụ aha eme ndị agbụrụ ya akaje maka na ya bụ yariba pụtara " muchi muchi na Onye ihu abụọ".

FFK sị na "agbụrụ m abụghị ndị muchi muchi maọbụ ndị ihu abụọ".

FFK sịkwa na ọ bụ otu aka ahụ ka ha sị akpọ ndị Igbo Yamiri.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe ndị Igbo jụru nke ha, ndị Yoruba nabata nke ha.

Ọ sị na agbụru ya bụ "Karo Jire" maọbụ "Oduduwa", ebe asụsụ ya bụ Anago.

FFK sị onye anwakwala anwa kpọọ ya onye Yoruba ma kpọkụọ ndị agbụrụ ya niile ka ha jụ aha ahụ kpam kpam.

Ọ sị na onye ọbụla na-aza aha ahụ site ugbua "amaghị ihe ọ na-eme onwe ya na ndị agbụrụ ya niile".

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

N'otu aka ahụ FFK kọtọkwara aha Naịjirịa n'akara twitter ya bụ nke ọ sị na ọ bụ ndị Bekee nyere ha aha ahụ nke ọ sị na ọ pụtara "obodo ọchịchịrị".

Ọ sị na aha ndị ahụ bụ mkparị nye ndị agbụrụ ha ma sị onye ọbụla azazịla ya.

AKụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, 'Dick Tiger tinyere ego ọ kụtara n'ọkpọ na nkwado agha Biafra' - Chijoke Ihetu