Nigeria vs P&ID: Naịjirịa anatala ikike ikpegharị ikpe ya na ụlọọrụ P&ID

Onyeisiala Buhari

Ebe foto si, @Nigeriangov

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu ọkaikpe na UK enyela Naịjirịa ikike ịgbagha ikpe e kpere nke sịrị ha kwụọ ụlọọrụ 'Process and Industrial Development' ego dị ijeri dọla itoolu na ụma isii.

N'ikpe mbụ e kpere n'ọnwa Ọgọst sị na Naịjirịa ga-ahapụrụ ụlọọrụ a akụnaụba ndị ọnụ ego ya ruru ijeri dọla itoolu na ụma isii ($9.6bn).

Mana n'ikpe nke a ọkaikpe na UK kpere n'ụbọchị Tọọzde 26 Ọgọst, 2019, ọ sị na Naịjirịa ga-agbanyụ ọkụ inye ụlọọrụ a akụnaụba ndị ahụ.

Nke a nyere Naịjirịa ohere ikuru ume dịka ikpe a ga na-aga n'ihu n'etiti ha na ụlọọrụ P&ID.

Ọkaikpe nyere iwu ka Naịjirịa kwụọ ụlọikpe a ego dị nde narị dọla abụọ ($200m) n'ime ụbọchị iri isii iji gbochie nkpachi akụnaụba ha.

Ndị so mee njem a gụnyere Okaiwu ukwu nke gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami, Mịnịsta mgbasa ozi bụ Lai Mohamed, na onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu.

Anambra agọọla bọjet ha

Bọjet Anambra Steeti

Ebe foto si, ABS/Facebook

Anambra steeti esorola na ndị mbụ wepụtara usoro mkpata na mmefu akụ bụ bọjet nke afọ 2020.

Willie Obiano bụ onye bupụtara bọjet a n'ihu ndị ụlọomeiwu nke steeti ahụ sị na otu ijeri narị naịra, iri atọ na asaa ka ha ga-etinye n'ọrụ n'ime afọ 2020.

Gọọmentị sị na isiokwu bọjet ahụ bụ maka nkwado ndị ntorobịa nakwa ịrụzi ihe eji enyere ndụ aka na steeti ahụ.

Ha sị na pesenti 43 bụ ijeri Naịra 58.69 ga-aba n'ụgwọ ọnwa nakwa ihe ndị ọzọ na-eme ka ọrụ na-aga werewere.

Ebe pesenti 57 bụ ijeri 78.3 ga-aba n'ọrụ ihe eji enyere ndụ aka dịka okporoụzọ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ na ihe ndị ọzọ.

Obiano sị usoro mkpata na mmefu akụ a ga-enye aka ịkpọbata ndị oji ego achụ ego na steeti ahụ.

Jacques Chirac a lala mmụọ

Jacques Chirac

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Jacques Chirac bụ onye ihe gbasara Yuropian Unionu masịrị nke ukwuu.

Onyeisiala mba France bụ Jacques Chirac alaala mmụọ mgbe ọ gbara afọ iri asatọ na isii.

Ọgọ ya nwoke bụ Frederic Salat-Baroux gwara ndị ntaakụkọ na Chirac lara n'udo.

Super Eagles na Brazil

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'egwuregwu, Super Eagles nke Naịjirịa ahọpụtala ndị ga-eso sọọ mpi enyi na enyi ha na mba Brazil n'ụbọchị 13 Ọktoba, 2019.

Onye nkuzi Super Eagles bụ Gernot Rohr kpọrọ ha Alex Iwobi, William Troost Ekong na Samuel Chukwueze.

Ndị ọzọ gụnyere Wilfred Ndidi na aha mmadụ iri abụọ ndị ọzọ ga-esọ ya bụ mpi na Singapọre.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị: