Southgate Preacher: Oluwole Ilesanmi eritela mmeri n'aka ndị uweojii Britain

Ebe foto si, Christian Concern
Oluwole Ilesanmi bụ ụkọchukwu na mba Briten eritela puku pounds abụọ na ọma ise n'aka ndị uweojii mba Briten maka nwụchi ezighi ezi.
Nke a mere dịka achọpụtara na nwụchi a nwụchiri ya n'ọnwa Febụwarị ebe ọ na-agbasa ozi ekwesighi ekwesi.
Ndị uweojii mba Briten kwukwara na ha nwere ikike ịnyocha ebubo ọbụla maka ịkpọ asị dịka eboro Ilesanmi
Na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa amanyela iwu ga-ekpokọba kọmiti nke ga-ahụ na nkwekọrịta African Continental Free Trade Area (AfCTA) bịara na mmezu n'ala Naịjirịa.
Ozi ahụ si n'obi gọọmentị etiti pụta na-ekwukwa na ụlọọmeiwu ukwu ga-etinye ọnụ n'okwu ahụ na nsonso a.
Ọzọ,

Ebe foto si, Stringer
Onye ọdeeakwụkwọ otu NLC bụ Peter Ozo-Eson ekwuola na gọọmentị etiti na ndị kọmịtị na-elekọta ndị ọrụ ga-ebido mkparịtaụka ọhụrụ n'izuụka a na-ebido maka ụgwọ opekatampe ndị ọrụ, n'ihi na nzukọ ochie ha amịtaghị mkpụrụ.
N'ofesi,

Ebe foto si, AFP
Ihe mberede mbuze na apịtị egbuola ihe ruru mmadụ iri atọ ebe a ka na-achọ ihe ruru mmadụ iri na ise na mpaghara ndịda China.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị Real Madrid akagbuola ọpụpụ Gareth Bale dịka ha ji ya mee ndị Jiangsu Suning dị na mba China akpịrị ogologo.
Ha sị na ọ ka ga-anọchapụ maọbụ ndị Suning akwụọ ha ụgwọ mkpọfe a kpọrọ "transfer fee".
Ebee a ka a ga-esu ya kpọm, bata n'ọgbakọ BBC Igbo.com anyị bụ ekwuchaa ọ gwụ na mgbasa ozi.
Akụkọ na Nkeji
Iheanacho achọtala ụkwụ o ji enye goolu ọzọ?

Ebe foto si, Leicester City Official Twitter
Kelechi Iheanacho nyere goolu abụọ dịka ndị otu bọọlụ ya bụ Leicester city na Rotherham United ji ọkpụ goolu abụọ abụọ laa n'ụbọchị Satọde.
Cheta na oruola onwa iri Iheanacho nyesoro goolu mana ọ dị ka ukwu ya achọtala ebe ọnụ goolu nọ ọzọ.
Boko Haram egbuola mmadu iri abụọ na atọ si akwamozu ala na Borno steeti.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu egbu-aṅụ-ọbara bụ Boko Haram egbuola mmadu iri abụọ na atọ na Borno steeti.
Nke a mere dịka ndị a si akwamozu n'obodo Goni Abachari alahachị Badu Kuluwu mgbe ndị omekome a ji ọgbatumtum were wakpo ha.
Ndị dinta na ndị nche bị na mpaghara ahụ kwuru na hụrụ ọzụ iri abụọ na atọ.
N'Ofesi,

Ebe foto si, EPA
Ndị uweojii na mba Rissia anwuchiela ihe karịrị otu puku mmadụ dịka ihe ruru puku iri abụọ mere ngagharị iwe.
Ndị na-eme ngagharị iwe a sị na gọọmentị nọ n'ọchịchị ekweghị ka ndị otu ndọrọndorọ ọchịchị anọghị nọ ọchịchi weta ohere họpụta ndị ga-eburu ha ọkọlọtọ.
Gee nkeji BBC ebe a:










