You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Argetina vs Columbia: Ndị nso nso kpụ Lionel Messi n'ọnụ maka asọmpị a
Ndị madụ ejirila ọchị na njakịrị merụọ Lionel Messi ahu dịka ndị otu bọọlụ Columbia jiri ha mee ihe egwuregwu ka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu were merie ndị otu bọọlụ Argentina.
Colombia yiri Argentina egwu dika Roger Martinez na Duuvan Zapata nke columbia jiri goolu otu otu were sị ha "ka emesia".
Ndị madu banyere twitter ikwa Lionel Messi emu.
@Wenko_De_Welco kwuru na ọdịda esighị Messi n'aka.
@llsteve20 kwuru na onye ụta dịrị bụ Ousmane Dembele.
@TheYBuhari na-ajụ onye a ga-ebo ọdịda Argentina n'isi?
@ahmerdrufai kwuru na Messi emereghị n'egwuregwu bọọlụ iri ọgbarala n'ime bọọlụ iri na atọ n'izu a
Ha mere nke a n'ihi na ha turu anya na dịka onye soro na otu bọọlụ Barcelona ndị buru Iko La Liga ma kwa dịka onye kacha nye Goolu na ya bu Messi kwesiri ime ka ndị otu ya merie.