You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chimaroke Nnamani vs Gil Nnaji: ụlọikpe mkpegharị ebiela nkwa n'ike
Akụkọ ndị dị mkpa ụtụtụ a:
Ụlọikpe ikpe mkpegharị dị n'Enugu "akwashiela" akwụkwọ Gilbert Nnaji gbara Chimaroke Nnamani bụ onye na-anọchite anya Enugu East na Ụlọomeiwu ugwu.
Nnaji gbara Nnamani akwụkwọ na arịọ ụlọikpe ka ọ napụ ya mmeri omeriri na ntuliaka 2019 maka na-osoghị usoro pati weputere were pụta.
Nke a bụ nke ugboro abụọ ya Gilbert Nnaji dara ada n'ụlọikpe maka ikpe a.
Nnaji gara ụlọikpe mkpegharị ka ụlọikpe nta gwachara ya na ihe ọrịọrọ ya enweghị isi.
Ụlọikpe ahụ machara Nnaji ikpe n'ihe atọ ọrịọrọ ya nke gụnyere na Nnamani anọghị mgbe pati PDP meere ha nyocha tupu ha apụta ya bu ntuliaka.
Mana pati ha bụ PDP gbara akaebe na Nnamani so usoro niile pati chọrọ.
Ụlọikpe ndị agha amalitela ikpe na Port Harcourt
Ụlọikpe ndị agha amalitela ikpe mmadụ iri na anọ ndi otu ha bụ ndị ha sị na ha tinyere aka na mpụ dị iche iche dịka ntọ, ọchụ na ihe ndị ọzọ.
Maj.-Gen. Jamil Sarham nke ụsụụ ndị agha Division isii na Port Harcourt sị na ndị agha ahụ sị na ogige ha.
Gọmentị Hong Kong akwụsịla iwu butere ngagharị iwe
Na Honk Kong, ọha emeriela gọment bụ ndị siri ọnwụ na ha ga-eti iwu ịbuga ikpe ndị mmadụ China bụ ndị metere ihe ikpe na Hong Kong.
Onye ọrụ gọmenti bụ Carrie Lam kwụru na gọmenti ga-akwụsịlata iti ya bụ iwu chebere onye ha echiche maka ọgbaghara so ya n'azụ.
Netherlands 3 - 1 Cameroon
N'egwuruegwu, mba Africa na-akwa arịrị ugbua n'iko mba mbauwa ụmụnwaanyị ebe Netherlands ji ọkpụ atọ asatara otu nyụọ Cameroon ịkpakwụ taa na France.
Gee nkeji
Ka enyeonye igbo "Majority Leader" n'ụlọ omeiwu ukwu
Ndị kwuru nke a bụ otu akpọrọ Igbo Amaka. Ha na-arịọ Onyeisiala Muhammadu ka ọ onye aka hụ na onyeisi ulo omeiwu nke Bekee kpọrọ "Majority Leader" ruru Igbo aka.
Ọnyeisi otu a bụ Michael Okoro kwuru nke a Ebonyi state si na odoro mmadụ niile anya na-ekewapuru ndị Igbo n'ihe gbasara ọchịchị na Naịjirịa n'agbanyehi mbọ ndị Igbo na-agba maka ọdịnma na ịdịnaotu nke Naijirịa
Ọ sị: "Anyi ghotara na ọ di n'aka Ọnyeisiala ịhọpụta onye odeakwụkwọ Naịjirịa nke mere ka anyị kweta na inye ọnye Igbo ọkwaa ga-egosi na Onyeisiala kwenyere na idiịnaotu nke ndị Naịjiria."
Micheal Okoro kwukwara ka ndị Igbo were obi umeala na ntụkwasị obi bịa Onyeisiala nso ma kwadokwa ọchịchị ya.
Cheta na pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Peoples Democratic Party (PDP) mere Eyinnaya Abaribe ihe Bekee kpọrọ "Minority Leader" n'Ụlọomeiwu ukwu.
Ụlọakụ Central Bank nke Naịjirịa ejikerele imachi akara ụlo akụ ụlọ ọrụ ndị ji ego ofesi ebubata ngwa ahia iwu
Central Bank nke Naịjirịa ekwuola na ọ ga-agbachi akara ụlọ akụ ụlọ ọrụ ọbula aka ya dị na iji ego ofesi bubata ahịa iwu amachiri na Naịjirịa.
Ụlọakụ Central Bank machiri iji ego ofesi go ma bubata ngwa 43 nke osikapa na ncha so n'ime ha.
Central Bank sị: "Mgbe ọbula anyị chọpụtara na ụlo oru ọbụla na-eji ego ofesi ebubata ahia iwu, anyị nwere ikike iwachi akara ọbaego ụlọaku ụlọ ọrụ ahụ."
N'ofesi,
Mba Jamani awụọla mmiri oyi n'ebubo mba Amerịka na-ebo mba Iran n'aka ha dị ogbunigwe gbara ugbo mmiri n'ime oshimiri dị nso na mba ahụ.
Jamani si na ihe onyonyo Amerịka weputara ezughi iji sị na ọ bụ Iran kpara mkpa mkpa a.
"Anyị ghọtara ihe onyonyo a gosiri kama ọ gaghị ezu iji kpebie ebubo a," Haeiko Maas Mịnịsta n'ahụ maka mmekọ Jamani na mba ndị ọzọ kwuru.
N'Egwuregwu,
Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ahọtala mba atọ ọ sị ga eme ọfụma na Iko Mba Africa.
Rohr gwala Goal.com na mba ndị a bụ Senegal, Tunisia na Egypt
Chetakwa na egwuregwu AFCON 2019 ga ebiri ọkụ n'ụbochị 21 nke ọnwa Jun.
Maka Naịjirịa, Maazi Rohr si na ọ bụ agba nke Semi Final ka anya ya di .