ASUU ọ ga-agba abụbụọrụ ọzọ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnyeisi ndị Academic Staff Union of Universities (ASUU) bụ Abiodun Ogunyemi azarala ọnụ ya na ndị otu ya

O kwuru na ego TETFund gọọmenti weputara ọhụrụ nke ruru nde nari naira abụọ na asatọ (N280M), esoghị na ego ha na ana Gọọmenti kamgbe afọ 2013.

Ọ gwara BBC Igbo nkea iji were zaghachị akụkọ na-ewuewu na sochal midia na gọọmenti emezuola nkwa ọ kwere ha.

Ogunyemi kwuru na ego TETFund a bụ ego dị n'iwu Gọọmenti dị na mbu enye mahadum niile na Naịjirịa.

Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na twitter

@amkareto kwuru ASUU pụta kọwara ndị mmadụ nke bụ eziokw maka ego a.

@Dara_Adenekan1 kwuru na ego agaghị ezu imere ndị ASUU ihe ọbụla.

@Dimeji_Shotunde kwuru na ego a gọọmenti etiti depụtara na o ji edozi mahadum Naịjirịa kwesiri me ka ASUU ghara ịgba abụbọ ọrụ ruo afọ anọ.

@TeamCOLE1 kwuru na ọ bụ iheọma ka Buhari mere Mahadum Naijirịa site na iwepụta ego ahụ.

O kwuru na ọ bụ nani ijeri narị naira abụọ na iri abụọ ka Gọọmenti kwụrụla site n'ime otu tarị naira na ọma gọomenti kwere ha na-nkwa.

Ogunyemi chọrọ ka Gọọmentị laghachị na ntuziaka ọgbakọ ehiwere maka inyocha mahadum nyere, maka ịdozi ihe niile mebiri emebi na Mahadum niile na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: