You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Father's day: Gịnị ka ụbọchị emume ndị nna pụtara gi?
Ndị nna de jeenu o!
Ta a bụ ụbọchị iri na isii nke ọnwa June, ọtụtụ mba na-eweliri ndị nna aka elu maka uru ha bara n'ezinaụlọ nakwa na nwulite obodo.
Onye nwere nna leta ya anya nke ọma maka ifunanya Nna nwere ebe umu ha nọ karịrị ego.
Ka emume a si gaa n'akụkọ ụfọdụ
Ndị nna siri nrị n'ebe dịka ụlọ ụka St, Barths Anglican Church dị na Satellite.
Ụfọdụ ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ gosiri obi ụtọ ha gbasara isi nrị ebe onye dịka Ụba Osakwe kwuru na agbanyeghị na ọ masịrị ya ime , o kwesịghị ị bụ mgbe ọ bụla.
Ụkọchukwu Emmanuel Umeh kwuru na ọ bụ ụbọchị eji agọzị ndị nna n'ụzọ pụrụ iche ma kwu kwa mkpa ọ dị ka ụmụnwoke na-etinye anya ụfọdụ oge ma esiwe nrị n'ụlọ makana o na-enye ụmụ nwaanyị obi
ụtọ ma di ha bia nyere ha aka n'usekwu.
Ebe Okenye Uche Aguegbo kwuru na ụbọchị a dị mma maka ị chetara ndị nna ọrụ ha ka ihe wee na-aga n'iru.
Ndị mmadụ kwukwara ọtụtụ ihe n'elu twitter
@OpeyemiOfficial kwuru na ọ hụrụ nna ya n'anya nke ụkwụ.
@atiku na-ekele ndị nna malitere Naịjirịa.
@JorimJerry kwuru na owu nna nwụrụlanụ na-ama ya.
@bukolasaraki kelere ndị nna niile na-agba mbọ imeta ndị na-elekwasa anya.
Nchọpụta Ọgbakọ 'European Union'
Ọgbakọ European Union agụpụtala ebe ndị Goọmentị dara iwu maka ntuliaka emere ma nyekwa atụmatụ na ntuziaka maka ime ntụliaka n'odịnihu.
Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na ha ga-eme ntuziaka European Union wepụtara maka ntụliaka ọdịnihu Naịjirịa.
Ọgbakọ "European Union" kwuru maka uru ọ bara ịhazigharị etu esi eme ntụliaka na Naịjirịa ma na-ekwu na etu esi chịkọta mpụtara ntuliaka 2019 adabachaghị ọfụma.
N'egwuregwu,
Ukraine efeela South Korea aka n'isi were ọkpụ goolu atọ asatara otu maburu iko mbaụwa ndị ntorobịa.
Nke a bụ nke mbu ndị Ukraine na-ebu iko mba uwa ndị ntorobia.
N'ofesi,
Ogbunigwe egbuola ndị uweojii ruru asatọ ebe ha nọ n'ụgbọala ngagharị nchekwa.
Onyeisi ndị uweojii na kenya bụ Hillary Mutyambai kwuru na ndị uweojii ruru iri na otu nọ n'ụgbọala ahụ na-agaghari n'oke kewara Kenya na Somali.