You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
May 29, 2019 in Nigeria: Taa ka ọchịchị ga-esi aka fere aka
Taa bụ abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee ka ọchịchị ga-esi n'aka fere aka dịka Naijiria na-abanye agba ọhụrụ n'ọchịchị onyekwuocheya.
Taa ka onyeisiala Muhammadu Buhari na-abanye agba nke abụọ dịka onyeisiala dịka o merichara na ntuliaka 2019.
Buhari banyeburu agba nke mbu ya na Mee 29, afọ 2019.
Ndị gọvanọ steeti na-aloghachi gụnyere; Dave Umahi (Ebonyi), Ifeanyị Ugwuanyi (Enugwu), Okezie Ikpeazu (Abia), Ifeanyị Okowa (Delta), Nyemso Wike (Rivers) na Emmanuel Udom (Akwa Ibom).
Ndị ọzọ bụ:
Samuel Ortom na Benue
Simon Lalong - Plateau
Atiku Bagudu - Kebbi
Nasir El-Rufai bụ gọvanọ ọhụrụ nke Kaduna
Ben Ayade - Cross River
Darius Ishaku - Taraba
Aminu Masari - Katsina
Mohammed Badaru nke Jigawa ga-abanyekwa agba nke abụọ ha dịka gọvanọ steeti ha dị iche iche.
E nwekwara ndị ga-abanye oche ọchịchị mbụ ha dịka gọvanọ ọhụrụ taa.
Ha gụnyere mmadụ dịka:
Emeka Ihedioha nke PDP (Imo)
Babajide Sanwo-Olu nke APC (Legọs)
Muhammad Inuwa Yahaya nke APC (Gombe)
Seyi Makinde nke PDP (Oyo)
Dapo Abiodun nke APC (Ogun)
Abdulrahman Abdulrazaq nke APC (Kwara)
Babagana Zulum nke APC (Borno)
Abdullahi Sule nke APC (Nasarawa) nakwa Muktar Idris nke APC (Zamfara).
Mana a gaghị enwe ndị ga-abanye ọkwa gọvanọ n'Anambra, Edo, Ekiti, Bayelsa, na Ondo na Osun dịka ha merela ntuliaka ha tupu ugbua n'ihi nsogbu gbaso ntuliaka e meburu na steeti ndịa n'oge gara aga.
Taa, dịka Mịnịsta Mgbasaozi bụ Lai Mohammed siri gbaa n'ama, a ga-eme emume mnyefe ọchịchị na nwayọọ, na-emeghị mkpatụ ọbụla.
Dịka o siri kọwaa, nke a bụ n'ihi na gọọmenti ebupụla emume ncheta ọchịchị onyekwuoucheya gaa ụbọchị Juun 12, n'iji kwanyere MKO Abiola bụ onye nwụrụ dịka ọ na-alụ ọgụ maka mmeri o meriri na ntuliaka Juun 12, afọ 1993.
Cheta na n'afọ 2000, ọchịchị Olusegun Obasanjo mapụtaburu ụbọchị May 29 dịka ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya iji cheta ndị uwe kakị iwere ọchịchị nyefee n'aka ndị nkịtị mana n'afọ 2018, ọchịchị Buhari higharịrị ya bụ emume buga ya n'abalị Juune 12 kwa afọ.