You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Inec akpọpụtala Ganduje dịka onye meriri na ntụliaka gọvanọ Kano

Akụkọ ihe na-eme na 'Alaigbo na gburu gburu Naijiria ebe a na-eme ntuliaka mmeju nke afọ 2019.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa

  1. E nweghị ọgbaghara ọbụla na Kano

    Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na ọgbaghara dapụtara na Kano ka a kpọpụtachara Umar Ganduje dịka onye meriri na ntuliaka.

    Kepukepu ahụ na-eso mgbopụta Inec kpọpụtara Abdulahi Umar Ganduje dịka onye mmeri na mmeju ntuliaka e mere na steeti ahụ na agbanyeghị mkpesa tigbuo-zogbuo sochiri ntuliaka ahụ e mere na Satode.

    Mana nchọpụta ndị ntaakụkọ BBc mere na steeti ahụ kwuru na ọ nweghị ndị ha hụrụ na-eme ngagharịiwe ebe ọ bụla na Kano taa bụ Monde.

  2. Ganduje Abdulahi emeriela ntuliaka ọkwa gọvanọ na Kano

    Ganduje onye ji ọkọlọtọ APC zọ ọchịchị gọvanọ na Kanọ steeti emeriela dịka Inec si kpọpụta ugbua.

    O nwetere vootu ruru otu nde na uma (1,033,695) ebe onye so ya n'azụ bụ Abba Yusuf, onye otu PDP nwetere vootu ruru otu nde na ụma(1,024, 713). Ganduje ji vootu ruru puku asatọ n'ụma wee gafee Yusuf.

  3. Lalong azọtala oche gọvanọ ọzọ na Plateau

    Onye bụ gọvanọ Plateau steeti kamgbe afọ anọ bụ Simon Lalong emeriela ntụliaka nke ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

    Lalong bụ onye otu APC ritere vootu ruru puku narị ise na ụma iji wee merie onye so ya n'azụ bụ Jeremiah

    Useni onye ritere vootu ruru puku narị ise na ụma mabụrụkwa onye otu PDP.

  4. Ortom alaghachitela ọzọ dịka gọvanọ Benue

    Inec akpọpụtala gọvanọ Samuel Ortom dịka onye meriri ntuliaka gọvanọ na Benue steeti.

    O nwetere vootu ruru narị puku anọ na ụma ebe onye so ya n'azụ bụ onye otu APC,Emmanuel Jime

    nwetere vootu narị puku atọ n'ụma. Inec gakwara n'ihu kwuo na onye ụlọọrụ ha ndị omekome gbara egbe mgbe o na-ebuga mpụtara ntuliaka mmeju ebe a ga-agụkọ ya nọ n'ụlọ ọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ.

  5. PDP emeriela n'okpuruọchịchị anọ n'Imo

    PDP ketara oke ukwu n'ime ntuliaka mmetọpụ e emere n'Imo steeti n'ụbọchị satọde.

    Ihe mpụtara gosiri na PDP were Ngor-Okpala, Orlu, Oguta nakwa Ikeduru.

    Ebe otu AA meriri sọsọ n'okpuruọchịchị Isu.

  6. Tambuwal emeriela na Sokoto.

    Dịka ọ dị ugbua, Inec akpọpụtachala mpụtara si na okpuruọchịchị ndị fọrọ na Bauchi na Sokoto steeti.

    Onye ji aha PDP azọ ya bụ ọkwa na Sokoto bụ Aminu Tambuwal bụ onye ha kpọpụtara na ọ zọtara oche Gọvanọ.

    Mohammed Bala nke PDP nọ n'ihu na Bauchi mana Inec akpọbeghi aha nke ya.

  7. Obi kooro ndị mmadụ n'elu ugbua na Tudun Wada wọdụ dị na Plateau steeti dịka ụmụntorobịa na ndị ọrụ nchekwa na-amaaka.

  8. Ọ na-ede jimjim na Kano, Plateau,Sokoto ebe tigbo zogbo sochiri mmeju ntulika emere nke gọvanọ na ụlọomeiwe taa bụ satọde.

    Onye ji ọkọrọtọ PDP bụ Atiku Abubakar ekwuola n’akara Twitter ya na ọgbaagha aghọla njirimara ya bụ mmeju ntụtilaka ebe atụrụ anya na nke a kwesiri ịka mma dịka a ebe a na-eme ya perempe.

  9. Na Kano, obodo bụ igwe

    Tigbuo-zogbuo chiri eze na mmeju ntuliaka nke Kano steeti.

    O nwere onye ndị agboro kupụrụ eze, nwe ndị e merụrụ ahụ n'ụzọ dị iche iche dịka ndị agboro na-achụsasị ndị mmadụ ọsọ na Kano.

    Ha nyerekwara ndị ntaakụkọ gụnyere ndị ntaakụkọ BBC ọsọ.

    Ha ekweghị ka e me ntuliaka n'ọtụtụ ọnọdxdụ atụmvootu.

    Mana ndị mmadụ kpọrọ ekwo nkụ pụta atụmvootu n'igwe

  10. N'Ikeduru,Imo, ndị mmadụ pasa n'ụlọ ha

    Ntuliaka na-aga n'ihu na Unit 011, Amachara, Ikeduru, Imo steeti.

    Mana ụfọdụ ndị biara ịtụ vootu nakwa ndị nnọchịte anya pati tụụ arịrị na o nweghị onye ahụrụ.

    ụfọdụ ndị mmadụ gawara ahịa, ebe ụfọdụ nọrọ onwe ha n'ụlọ.

  11. Plateau na-ede jijiji

    Mmeju ntuliaka a na-eme na Plateau steeti dị ka ebe a na-akwado agha.

    Ndị na-atụ vootu na ndị ọrụ nchekwa e nweghị onye kwere na ọkụ nwere ihe o ji nti oke eme.

    Na Tudun Wada Wọọdụ dị na steeti ahụ, ndị ntorobia na ndị ọrụ nchekwa na-adọrịta ụka.

    Mana ọ bụghị ebe niile a na-eme na steeti ahụ na-agkpọ ghara ghara dịka ndị dị ima, ma ndị ọrụsị sonyere tụọ ntuliaka n'ọnọdụ atunvootu ụfọdụ.

  12. Ndị mmadụ apụtaghị ka o kwesiri n'Imo

    Ntuliaka ebidola na ebe ụfọdụ e kwesịrị inwe ntuliaka taa n'Imo steeti.

    Mana na ndị mmadụ apụtaghị n'igwe dịka e siri tụọ anya.

    Onye ntaakụkọ anyị bụ Paul Chukwu onye na-agagharị n'ebe ndị e nwere ntuliaka kwuru na ntụliaka ebidola na Unit 004 Amambaa Primary School, Ebikoro Uzoagba, Ikeduru Imo steeti mana ebe niile dịka ebe udele nwụrụ.

  13. Bauchi na-ekwo ka idemmiri

    Ndị mmadụ achọghị ka a kọrọ ha akọọ maka mmeju ntuliaka na-eme ebe ahụ dịka ọtụtụ pụtara n'ọdọ atumvootu maka ntuliaka.

  14. N'Enugwu, #MarketMarch na-akpọtụ 'I metụzịna m aka'

    A naghị anọ otu ebe ekiri mmọnwụ.

    BBC Igbo nọ ugbua n' Ogbete, Enugwu ebe a na-eme na #MarketMarchOgbete.

    Nke a bụ ngaghiriiwe ụmụnwaanyị ji agwa ndịahịa sị, 'I metụzịna m aka.'

    "Bia zụrụ m ahịa abụghị" bụ ọnụ ka e ji ekwu ya ọ bụghị aka.

  15. Ntuliaka amalitela n'ebe ụfọdụ na Sokoto

    Ewu na ọkụkọ gwụrụ n'ụlọ n'obodo Dogon Daji dị na Sokoto steeti dịka ndị mmadụ pụtara n'igwe ime ntuliaka.

    Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ kwuru na ntuliaka ebirila ọkụ n'ebe ahụ.

  16. Na Kano, a na-achụsasị ụfọdụ ndị pụtara atụmvootu

    Ndị mmadụ pụtara n'igwe n' Okpuru ọchịchị Dala dị na Kano steeti mana anya ahụbeghị ndị ọrụ Inec.

    Obi koo ndị mmadụ n'elu dịka a na-achụsasị ndị nọchiteanya pati ndị anọghị n'ọchịchị pụtara maka atụmvootu.

    E tiri otu nwaanyị nọ na-agbasa ozi sị ndị mmadụ pụta tụọ vootu maka nnwereonwe ihe, dọkaa hijab ya, ebe e nyere ndị ntaakụkọ ọsọ.

  17. Ndị Sokoto arahụkwara n'ụlọ?

    Na Bodinga dị na Sokoto steeti, ozi onye ntaakụkọ BBC bụ Abdou Halilou siri wetara anyị na-ekwu na a gha ọka, o koro n'elu n'ebe ahụ n'ihi ndị mmadụ mara ụzọ pụta ịtụ vootu dịka aja dị n'ala; ma nwoke, ma nwaanyị, nakwa ndị na-eto eto.

    .

  18. N'Imo, Ihe gbasara mmeju ntuliaka bidoro ụnyaahụ

    Ndị Ụlọọrụ INEC na steeti Imo gosiri nkwado ha banyere mmeju ntụliaka 2019 e ji ahọpụta ndị nnọchiteanya nke steeti n'ogbe dị iche iche bụ nke e hiwere ụnyaahụ.

    Okpuru ọchịchị ndị nke a metụtara gụnyere: Ikeduru, Isiala Mbano, Ngor-Okpala, Orsu, Isu, Orlu, Oguta nakwa okpuruọchịchị Njaba.

    E yighariri ntụliaka a n'ihi ọgbaghara nakwa tigbuo zogbuo pụtara na ntụliaka mbụ e mere.

    Inec bagidere atụmatụ ikesa akụrụngwa ndị ahụ dịgasị mkpa eji eme ntụliaka .

    Mgbe Paul Chukwu onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụlọ ọbaego ukwu CBN n'ụbọchị Fraide, ọ hutara na nkesa akụrụngwa a na- aga n'ihu dịka o si kwesi.

    Mbo ọ gbara ịmata etu ụlọọrụ a si akwado kụrụ afọ n'ala, dịka onu na-ekwuru Inec na steeti Imo jụrụ ịza oku akpọrọ ya n'ekwentị.

    Mana onu na-ekwuru ndị uweojii na steeti Imo bụ Orlando Ikeokwu, kọwara njikere ndị uweojii dị iji nye ezi nchekwa na ntụliaka a.

  19. O nweghị onye m na-akwado- Buhari

    Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari akpọọla ụmụ Naijiria oku ka ha apụta n'igwe tụọ vootu na mmeju ntuliaka 2019 a na-eme taa na mpaghara ụfọdụ na steeti iri na asaa na Naijiria.

    Buhari onye kwuru nke a n'abalị Fraide site n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ya bụ Garuba Shehu, gọrọ agụgọ na o nweghị onye ya na-akwado iche na ntuliaka ahụ.

  20. Ndewoonu , Igbo bụ ụmụ Igbo!

    Taa bụ Maachi 23, ka a na-eme mmeju ntuliaka ọkwa Gọvanọ nakwa ụlọomeiwu na steeti ebe ọ gbajọrọ.

    Soro anyị dịka anyị na e wetara gị nke na-eme na mpaghara ụfọdụ na steeti Imo, Bauchi, Sokoto, Adamawa,Kano, Plateau,Benue nakwa ebe ndị ọzọ.