Deji: Charlie Boy bụ meremere n'ihu gwọpịtị n'azụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Charles Oputa bụ otiegwu a ma-ama dịka 'Charly Boy' akọwala etu mmiri si banye opi ụgbọghọrọ n'ebubo e boro ya na ọ naara ndị ọchịchị Buhari ego iji katọọ Atiku Abubakar.

Onye na-alụ ọgụ maka ikike ruru onye a kpọrọ Deji Adeyanju ma bụrụ onye ya na Charly Boy jirikọrọ aka hiwe 'Our Mumu Don DO' boro Charly Boy ebubo ị nara gọọmenti etiti ego oge a tụnyere ya na mkpọrọ iji katọọ Atiku Abubakar ma kwụsịkwa ịkatọ Buhari.

Adeyanju kwuru na oge ya jụrụ Charly Boy nke bụ eziokwu, na Charly Boy n'ezie na ha nyere ya ego ma ego ahụ abụghị iji megide Atiku kama na ọ bụ ego ha nyere ya iji na-akwado ya bụ Charly Boy.

Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na Charly Boy nwere Oputa kwuru na ya ma ihe na-eri Deji Adeyanju nri n'afọ na ọ bụghị ebubo ọ na-ebo ya.

Oputa kwuru na n'ezie na Festus Keyamo bụ ọkaiwu APC nyere ya ego mana ego ahụ bụ ego ọrụ ọ rụrụ ha dịka onye na-emepụta ihe onyonyo.

"Ana m arụ ihe dị iche iche, ihe onyonyo, 'documentary'. Ihe niile m na-eme nwere akụkụ achụmtaego.

"E mechara m ihe onyonyo 'Park n Go,' ha na-asị na m naara ndị PDP ego, na ọzọ akpọrọ 'Another guy man wan enter' ha asị kwa na m nara ego.

"Agwaala m ndị mmadụ na APC na PDP o nweghị nke nwere isi. Ya mere m ji gwa ndị otu Sowore ka ha jịkọta ọnụ hazie 'Third Force."

"Ihe butere okwu bụ na m chọtala ndị ọrụ NGO doro anya dịka onye ọ bụ kemgbe ha ji bata ka ọdịzị a ka ụgbọ na-achọ ịgha ha."

Mgbe BBC jụtara ọnụ Adeyanju, O kwuru na "Ihe Charly Boy mere tụrụ m n'anya." n'ihi na ọ wụrụ ya n'ala.

"Agaghị m ata ndị mmadụ na-agbagha Naijirịa aga mba ofesi ụta."

"Ka m tinye uchu na inwetakwa onwe m ọzọ."

Akụkọ ga-amasị gị