Abia state: Anyị akwapịaghị ụlọ oriri ndị ahụ maka akwụnakwụna

Gọọmentị Abia steeti akọwarala BBC Igbo ihe mere ha jiri gbachie ụfọdụ ụlọ oriro n'Aba.

Okaiwu Ikpeazu gwara BBC Igbo na ọ bụghị maka ụmụnwaanyị na-agba akwụnwa ebe ahụ butere mgbachi ahụ.

Ha kọwara na ọ bụ maka na ebe ahụ aghọrọla ụlọ ebe ndị ohi na-ezukọ onwe ha ma na-akpa mkpamkpa.

N'ọnụ ya "nchekwa ndụ na akaụnaụba ndị mmadụ bụ ihe dị gọmentị Abia steeti mkpa."

O kwukwara na o teela aka ha na-anụ akụkọ gbasara mwakpo ụmụnwaanyị na mwakpo ndị mmadụ na-agafe n'akụkụ ebe ahụ.

Ugbua a na-akwado ịkwapịa ụfọdụ ụlọ ndị ebe Ikpeazu kwuru na "a ga-etinye osisi ọkụ latrịk n'okproụzọ ebe ahụ'.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: