Nigeria Elections 2019: A ga m agbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị- Eze

Ebe foto si, Lawerence Eze
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụlọikpe achụtuola Lawrence Eze bụ onye na-azọ oche Enugwu-East n'Ụlọomeiwu Ukwu.
Jọstịs Ibrahim Buba onye nyere mkpebi ahụ n'ụlọikpe ukwu d nke etiti nọ n'eEnugwu ụbọchị Tuzde kwuru na ahọpụtaghị Eze nụzọ ziri ezi.
Ka BBC Igbo kpọtụrụ Eze na-azọ ọchịchị n'okpuru APC, o kwuru sị "anyị kwụ chịm".
O kwukwara na ndị mmadụ gbachị akụkọ na-agagharị n'ikuku nkịtị, makana ndị ọkaiwu ya na-akwado ịgbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpegharị.
Ọ gara n'ihu gwa ndị na-akwado ya kee nkwụcha ma dị njikere ịtụnyere ya vootu na ntuliaka na-abịa.








