Ụlọikpe achụdala sinetọ Aidoko

Ebe foto si, Atai Aidoko /Facebook
Gabriel Kolawole nke Ụlọikpe ukwu nke ọkaikpe dị n'Abuja achụdara sinetọ na-anọchite Kogi-East (PDP) bụ Atai Aidoko ma nye Isaac Alfa ọkwa ya.
Kolawole kwuru na mwepụta ewepụtara Aidoko dịka onye ga-anọchite PDP na ntụliaka imeụlọ PDP mere n'ọnwa ikpeazụ nke afọ 2014 adabaghị ma nye iwu ka Inec nara ya akwụkwọ mmerị ha nyeburu ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọkaikpe nyekwara iwu ka e duo Air Marshall Isaac Alfa (rtd.) nke otu PDP n'iyi ọrụ.
Ka e wepụtachara Aidoko dịka onye ga-anọchite PDP na ntuliaka imeụlọ PDP, ka Alfa gbara ya akwụkwọ n'ụlọikpe rịọ ka ụlọikpe kagbuo mwepụta ahụ.
Ụlọikpe nyere Inec iwu ka ha nye Alfa akwụkwọ mmeri ọhụrụ dịka onye meriri na ntuliaka imeụlọ nke PDP mere n'abalị asaa nke ọnwa Disemba afọ 2014
Ụlọikpe dakwara Aidoko nha n'otu PDP N750,000.






