Nigeria election 2019: Ọ bụrụ na Ndigbo ekweghị, e kwenyere anyị - Ifeanyi Olumba

Ndị Igbo

Ebe foto si, Amarachi Atama

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo etinyela ọnụ n'ihe gbasara ọnụọgụgụ Ndigbo bị n'ọwụwa anyanwụ ga-atụ vootu na ntuliaka na-abịa.

Ifeanyị Olumba bụ okwuru ọha gwara BBC Igbo gwara na ọ gbagojuru ya anya etu o si bụrụ naanị ndị nọ na mpaghara 'Ọwụwa anyanwụ ruru nde iri denyere aha n'akwụkwọ.

O kwuru na ọtụtụ Ndigbo si mba ofesi gara n'ala Igbo ga debanye aha mgbe a na-anata "PVC".

Olumba kwuru na ọ bụrụ na Ndigbo apụtaghị were PVC ha n'uju mgbe ahụ na ihe ọ pụtara bụ na ndị ọzọ ga-ahọpụtara ha onye ga-achị ha.

Onye ọzọ nwere echiche pụrụ iche bụ Ike Abonyi, onye bụ ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị kwuru na ọnụọgụgụ ahụ a gụnyeghị Ndigbo nọ na mba ọzọ dịka Legos.

O kwuru na Ndigbo bi na mba ndị ọzọ ka ndị bi n'ọwụwa anyanwụ ya mere n' ọnụọgụgụ ahụ enweghị ihe o mebiri.

Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ntụlịaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission(INEC) ekwuola na mmadụ nde asatọ na ọma debanyere aha maka ntụlịaka na-abịa.

Onyeisioche ha bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a na nzukọ ndị isi ala n'Abuja.

Kedụ mmadụ ole bi n'ọwụwa anyanwụ ga-ebinye aka na ntuliaka a?

N'ime mmadụ nde iri asatọ ga-ebinye aka na ntụlịaka na-abia, ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ(South east) pekarịchaa na mpe.

Ha dị mmadụ nde iri.

Ndị kachasị were denye aha maka ntụlịaka a bụ ndị ndịda ugwu(North West) dị nde iri-abụọ.

Ọnụọgụgụ a ji pasenti otu gafee nke afọ 2015 bụ 11 pasenti.

Ntụlịaka nke onyeisiala ga-amalite n'ụbọchị Satọde bụ 16 Febụwarị, tinyere ntụlịaka nke ndị gọvanọ na ụlọomeiwu obere bụ ụbọchị Satọde, 2 March, 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: