Nnamdi Kanu: Ndị agha Naịjiria jiri nwayo na-akpasu ndị otu IPOB maka nsogbu- Achalla

Onyeisi ndi otu IPOB na United Kingdom ekwuola na ndị agha Naịjirịa enweghị ihe ha achị makana ha na-achere onye na-ekwesịghị aka mgba.

O kwuru na ọkwụ ọkụ mmụọ Nnamdi Kanu kwuru bụ eziokwu mana ndị ọchịchị Naịjirịa anaghị ekwu eziokwu.

Achalla kwuru na ihe Nnamdi kanu na-achọ bụ ndị ọchịchị nye ndị Igbo ohere ka ha mee mbinye aka nke nwereonwe ha nke a na-akpo referendum.

O kwuru na ndị agha Naịjirịa amaghị ọrụ ha ọfụma makana ọ bụrụ na ha ma ha ga-eje kpọpụta ndị ọchị ehi na-egbusisi ụmụ mmadụ.

Ọ jụrụ ebe ndị agha Naịjịrịa nọ mgbe Nnamdi Kanu pụrụ na Naịjirịa.

Cheta na ụlọọrụ ndịisiagha Naịjirịa dị n'Abuja kwuru na ha dịla njikere ị memina onyeisi otu IPOB bụ Nnamdi Kanu makana o kwuru na ọ ga-ewete ọkụ mmụọ ma ọ bata obodo Naịjirịa.

Ha kwekwara mkwa na ha ga-akwụsị onye ọbụla maọbụ otu ọbụla ga -achọ i bute ọgbaghara na Naịjirịa.

Ha nyere onye ọbụla na-ekpokoba ngwaagha maka ị ghasasi ntuliaka 2019 na ha chegharịa maọbụ ha chere ogolo aka iwu obodo ga-adakwasi ha.

Ọ bụ onyeisi Ngalaba mgbasaozi ha bụ Brig-Gen. John Agim dọọrọ aka na nti a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ maka etu ndị Naịjirịa sị emeri na atụmaatụ ha na Naijirịa na Abuja.

N'ọnụ okwu ya, nhazi 777 na-aga n'ihu, onye ọbụla bu ọkụmmụọ abata Naịjirịa mara amara na ha na nhazi 777 ga-akwatụ ya, ọsọ kwa ya ya bụrụ Nnamdi maọbụ onyeọbụla."

Agim kwuru na ọ bụ maka ndị na-achọ itisa Naịjirịa ka eji wepụta atụmaatụ 777.

O kwuru na nhazi 777 nke bidoro n'ọnwa October asatọ, egbuola ndị ekperima na oshi ruru iri atọ na ise ma nwụchie mmadụ a na-enyocha maka nrụrụaka ruru iri itoolu na asatọ.

Agim kwuru na ọ bụrụ na ha nyocha ndị a chọpụta na aka ha adịghị ọcha, ha ga-ewere ha nyefee n'aka ndị uweojii.

Akukọ ndị ga-amasị gị: