Stew: Ị ga-erinwụ ofe tomato esi China wee tụbata?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kamgbe ụbọchị ole na ole gagoro nụ, okwu 'Stew' ka na-ewu na soshal media.

Akụkọ pụtaburu na ndị uweojii Naịjirịa na-ahụ maka ịgbochị ngwaahịa ọjọọ ị bata na Naịjirịa anwụchiela ofe tomato (stew) eji ego ruru nde naira iri abụọ na asatọ esi China wee tụbata.

Ndị mmadụ kọwakwara egwu ọhụrụ otiegwu ama ama bụ Wizkid tiputere ka stew ose juru n'ime ya mana ndị mmadụ ka nwee echiche puruiche gbasara stew nke esi China ebụbata.

Osote onyeisi ndị uweojii Naịjirịa na-ahụ maka ịgbochị ngwaahịa ọjọ ị bata na Naịjirịa bụ Abdullahi Kirawa kwuru na ya bụ atumaatu dị njọ makana o nwereike merụ ahụike ahụ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na Soshal midia

@mr_phaisal kwuru na ọ ghọtaghị udiri ofe tomato ndị mmadụ na-atụbata na Naijiria

@Griffinstreaks kwuru na iwe na-ewe ya maka etu mmadụ sị kulite ga tụbatawa ofe tomato na mba ọzọ.

@smart33hypertek kwuru na ndị na-atụbata ofe Tomato na Naịjirịa chọrọ igbu ụmụ Naịjirịa.

@FutureRoyal kwuru na ọ ma na ọ ga-abụ onye Igbo tụbatara ya bụ ofe tomato.

‏@Ameer_SSani kwuru na ọ ga-ebido tụbatawa garri ebe ọ bụ na ana -atụbatazị ofe tomato na Naịjrịa.

@Duke4ril1 juru kedụ ka mmadụ ga-esi hapụcha ihe ndị ọzọ bara uru ga tụbawa ofe tomato.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: