Osun Election: A na-akwazị mgbọ n' Oshogbo

Ka ndị Oshun steeti na-akwado mmegharị ntuliaka na ọdụ vootu ise nke a ga-eji mara onye ga-abụ gọvanọ steeti ahụ, ndị a na-eche na ha bụ ndị otimkpu ndị ndọrọndọrọ na ndị uweojii kwakọrọ mgbọ ụnyaahụ na mpaghara Alekuwodo nke dị n'Oshogbo.
Ụlọ ntaakụkọ Premium Times dere na mgbọ tụrụ mmadụ atọ, nke otu onye n'ime ha bụ nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ.
Onye ntaakụkọ BBC nọ n'obodo ahụ kwuru na akwamgbọ a mere, ma kwukwa na ya hụrụ mgbe ndị uweojii bịara kpụpụ ụgbọala otu onye isi ya gbagotere na PDP nke Oshun steeti aha ya bụ Fatai Diekola.
Nke bụ n'azụ ka ndị isi aba okpu mebiri ya bụ ụgbọala.
Premium Times dere na nwanne nwatakiri a mgbo tụrụ gwara ha na ọ bụ n'ihu ebe ha na ere ahịa ka mgbọ bịkwụrụ nwa ada ahụ.
Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ọgbaghara a bidoro na ehihe ụnyaahụ mgbe ndị a na-eche na ha bụ ndị na-akwado PDP na ndị nke APC nwere nsogbu.
O kwukwara na obodo ahụ dị juu n'ụtụtụ a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






