National Assembly: Ha agaghị amalitezi echi etu ha si kwuo na mbụ

Ụlọọrụ ndị Sineti Naịjiria

Ebe foto si, @NGRSenate

Mmepe ndị ụlọomeiwu kwesiri ịbụ echi bụ Sepụtemba 25 agaghị enwezi isi ebe ha kwuru na ha adọtịala ụbọchị mmepe ha gaa ọnwa bụ na-abịa bọ Oktoba.

Odeakwụkwọ ụlọomeiwu bụ M.A Sani-Omolori kwuru ụnyaahụ na ha ga-alọghachitezi ụbọchị 9 ọnwa Oktoba.

O kwuru na nke a bụ maka ntuliaka imeụlọ nke pati dị icheiche nke ndị nọ n'ụlọomeiwu so na-eme ugbua.

N'akwụkwọ mgbasaozi Omolari dere, o kwuru; 'Nke a bụ ịgwa ndị sinetọ niile na ndị nnọchite anya na mmepe ọgbakọ n'ụlọomeiwu kwesiburu ịbụ ụbọchị Sepụtemba 25 ga-abụzi ụbọchị Oktoba 9 maka ntuliaka imeụlọ nke ndị pati dị icheiche.

"A na-atụ anya na ndị sinetọ niile na ndị nnọchite anya ga-amalite ọgbakọ ha ma ọ kụọ elekere iri nke ụtụtụ ụbọchị Oktoba 9, biko."

A nụbuola kepu kepu na a ga-adọti ya bụ mmepe mana ndị ụlọomeiwu gbachiburu nkiti.

Nke a pụtara na ndị ụlọomeiwu ga-esonye na ntuliaka imeụlọ nke pati ha dị icheiche ọkachasị iji zọọ ọkwa dị icheiche ha na-azọ nakwa ịlọghachite n'ụlọomeiwu maka ndị chọrọ ilaghachite.

Bukola Saraki

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A na-ekpe Sarakị ikpe maka ekwuputachaghị ihe niile o nwere

Ntuliaka imeụlọ nke pati dị icheiche

N'akụkụ nke ha, pati dị icheiche dịka APC bụ pati nọ n'ọchịchị nakwa PDP dọtịrị ntuliaka imeụlọ ha.

Ndị APC kwesiburu ime nke ha ụbọchị Sepụtemba 25 mana ha dọtịrị ya abalị abụọ ka ọ bụrụ ụbọchị Sepụtemba 27.

N'aka nke ọzọ, otu pati PDP ga-eme ntuliaka imeụlọ ha malite na nke dị chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ steeti dị icheiche nke a ga-eme n'abalị 27 ọnwa Sepụtemba ebe a ga-eme nke ndị sinetọ na nke ndị ụlọomeiwu n'abalị 28 na 30 otu ọnwa Sepụtemba ahụ.

Nke ndị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala ga-abụ ụbọchị 5 na 6 ọnwa Oktoba 2018.

Cheta na ụlọomeiwu nọ n'ọkụ tupu ha ala ezumike ebe ụfọdụ ndị sinetọ na ndị nnọchite anya hapụrụ pati APC banye PDP na pati ndị ọzọ.

Akụkọ na-ekwu na o nwereike ịbụ maka na onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki achọghị ka a chutuo ya mere o jiri dọtịa ụbọchị mbido ha.

Mana ihe ha kwuru mere ha ji adọtị ya bụ maka ntuliaka imeulo nke pati ha dị icheiche.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị