Nigeria Air: Gọọmenti akwụsila ụgbọelu ha kwadoburu iwepụta

Ebe foto si, Getty Images
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Sirika depụtara n'akara Twitter ya na: "ọ bụrụ m ihe nwute na gọọmentị etiti n'ọgbakọ 'Federal Executive Council' nwere mkpebi ikwụsị ụgboelu nke Naịjirịa bụ "Nigeria air".
"Anyi ga-emezu nkwa niile anyị kwere. Anyi kenere ọhaneze maka nkwado ha".
Cheta na ya bụ ụgbọelu ha wepụtara n'ọnwa Jụlai iri na asatọ (23 Jụlaị) nke afọ 2018 na London bụ nke ha kwadoro iji wee wekete Obodo Naịjirịa ana Mba ụwa niile.
Mgbe gọọmenti etiti kpọpụtara aha ụgbọelu a, Sirika kwuru na "ọ ga-abụ ihe na-ewebata ego karịa ma ị bụ ihe eji e nyere ndị mmadụ aka".
"Goọmentị etiti a gaghị e lekọta ya, ọ ga-abụ ọrụ ndị oji ego ahụ ego ị hụ maka ya."
Na akwụkwọ mkpata na mmefu akụ nke 2017, gọọmentị etiti wepụtara ego ruru nde narị naira 555 maka ị wepụta ya bụ ụgbọelu ma keputakwa ndị ga-ana hụ maka ya nde narị naira 200.
Na nke afọ 2018, ha wepụtara nde narị naira 50 ma kepụta nde narị naira 20 maka ndị ga-ana hazi ya.
Mana ọtụtụ mmadụ akatọla ya bụ ihe were na-ekwu na ọ bụ imefusi akụ na ụba Naịjirịa.
Lee ihe ha na-ekwu na Twitter:
@igweofficial na-ajụ gịnị mere gọọmenti etiti ji emefu ego niile a n'iwepụta ya bụ ụgbọelu ebe ọ bụ na ha ma na ha agaghị emeru ya n'isi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@ZaxmaOmar kwuru na ihe a abụghị ezigbo akụkọ makana ọ maghị ka o ga-esi saa ndị na-akatọ ọchịchị Buhari.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@ileife kwuru na gọọmenti ga akwụghachi ego niile ha mefuru mgbe ha gara London ị wepụta ya bụ ụgbọelu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Akụkọ ndị ga-amasị gị:









