Mukaila: 'Ije m sị Legos gawa Abuja maka Buhari bụ ihe efu'
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Muhammad Mukaila kwuru na ọ bụrụ na ọ ma ọ kara aga ya bụ njem.
Ọ gwara ndị nataakụkọ na tọọsde na ọ na-ewute ya na o mere ya bụ njem maka ị ṅụ mmeri onyeisiala Muhammadu Buhari na ntuliaka 2019.
O jikwa ohere a kwupute mbido njem iwe site Lagos ruo Abuja na-ekwukwa na o mere ya ka o wee gosi gọọmentị Buhari na iwe na-ewe ndị ntorobia Naijirịa makana ha emezughị nkwa ha kwere.
Mukaila onye bụ akpatị ozu edere laa n'udo APC nke pụtara "R.I.P APC" kwuru na ọgaghị a tunyere onye ọbụla nọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị ugbua a.
N'ọnụ ya, "ha kwere anyị nkwa ị nye anyị ọrụ ruru nde atọ mana ha enyewụghị anyị ọrụ ruru puku ise. Ha kwuru na ha ga-ebutu ụgwọ mmanụ ụgbọala ka ọ nọrọ na N45 mana ugbua ọ bụzị naira N145. Ha kwukwara na otu naira na dọla ga ha mana ụgbua ọ na naira N400." Ya mere anyị ji sị na anyị achọghịzi APC.
Mukaila kwuru na ya bụ njem abụghị nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla kwadoro kama o kwuru na ọ bụ ego ya ka o ji mee ihe niile gbasara ya bụ njem.
Njem ọ gara mgbe ahụ bụ iji wee gwaa APC ka ha hazie Naịjirịa nkeọma.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia:
@kcnaija chetara ndị mmadụ ka Muhammadu si wee gaa njem na 2015.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana onyeisi ndị APC n'Enugwu bu Ben Nwoye kwuru na Mukaila bụ onye ije na-atọ ụtọ.
O kwuru na ọ bụ ihe ọjọ na ọ fụghị iheọma niile Buhari mere kamgbe ọ banyere ọchịchị kama na ọ bụ sọ ndị ọ na-emeghị ka Mukaila na-ekwupute.
Nwoye kwuru na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ egobiela Mukaila ya kpatara o ji ekwu okwu etu ahụ.
O kwuru na ya bụ nwoke chọ ya jee elu jee ala, Buhari anwaala nkeọma.









