Alex Iwobi aghọọla onye ihe nkiri Nollywood

Alex Iwobi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iwobi bụ nwa nwanne Austin Okocha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ihe na-ewu ugbua na soshal midia na-egosi onye ọgba bọọlụ Alex Iwobi dịka onye na-eme ihe nkiri.

Iwobi dere na Instagram peegi ya na ọbaala ihe nkiri Nollywood.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Ugbua, ewepụtabeghị ihe nkiri a a kpọrọ 'Inpadisu' ebe ndị mmadụ ga-ekiri ya.

Mana ndị ihe nkiri na-amasị nakwa ụmụnwaanyị mkpụrụobi ha na-ama jijiji maka Alex Iwobi ekwuola na ọ tọgbuola ha na Alex Iwobi pụtara n'ihe nkiri a.

O nweghị ọtụtụ ihe anyị mara ugbua maka ihe nkiri a, mana n'ime ihe nkiri otu ntabi anya anyị hụrụ n'ihe pụtara na Instagram, na-egosi otu nwoke na-achụ Iwobi nnukwu ọsọ dịka onye chọrọ igbu oke.

Iwobi dere na nke a bụ nke mbu ọ pụtara n'ihe nkiri Nollywood.

Nke a mere ka ndị mmadụ na-aja ya mma maka na o meghị dịka onye na-eme ya nke mbu.

Iwobi dị afọ 22, bụ onye ọgba bọọlụ otu Super Eagles nke Naịjirịa nakwa onye otu Arsenal na mba Briten.

O so otu Arsenal merie n'asọmpi iko FA n'afọ 2017 nakwa FA Community Shield n'afọ 2015 na 2017.

Akụkọ ga-amasị gị