Ebenezer Cobb Morley: Ncheta 'Nna egwuregwu bọọlụ'

Ebenezer Cobb Morley
Nkọwa foto, Ebenezer Cobb Morley

Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị etu egwuregwu bọọlụ na iwu na-achị ya si malite rue ogogo ọ nọ ugbua.

Ị maara onye mere egwuregwu bọọlụ jiri dị ụtọ ma bụrụ ihe a na-agba nkiri n'ụwa niile taa?

Aha ya bụ Ebenezer Cobb Morley, o mere nke a mgbe egwuregwu bọọlụ na-enweghi usoro eji agba ya.

Edere iwu ọhụrụ a n'afọ 1863

Ebe foto si, Adrian Roebuck

Nkọwa foto, Edere iwu ọhụrụ a n'afọ 1863

Morley kpọkọtara ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnwa Ọktoba afọ 1863 bụ ebe ha dere iwu ga na-achị egwuregwu bọọlụ.

Ha malitere iwu a na mba Ịngland mgbe e hiwere otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ.

Iwu a bịara mụbaa banye na mba ụwa niile agbanyeghị na ọtụtụ ihe agbanwela n'ime ya.

Akara ntụ-ntụ

Ihe ndị i kwesiri ịma maka Ebenezer Cobb Morley

Ili ebe eliri nna mụrụ egwuregwu bọolụ

Ebe foto si, Justin Cormack

  • A mụrụ ya n'afọ otu narị na iri asatọ na asaa gara aga, n'obodo Hull dị na mba Ịngland
  • Ọ bụ onye ọkaiwu, bụrụkwa nwa onye minista
  • Ọ hụrụ egwuregwu mmiri n'anya nke ukwuu nke oji hiwe otu Barnes na Mortlake Regatta n'afọ 1862.
  • O bụ onye ndu otu bọọlụ Barnes mgbe egwuregwu bọọlụna-enweghi isi ọbụla.
  • Morley bịara hiwe ọgbakọ na Freemason Tavern nọ na Holborn n'ọnwa Ọktoba afọ 1863 bụ ebe amalitere otu na-ahụ maka bọọlụ.
  • Morley dere iwu dị iri abụọ na atọ ga na-achị egwuregwu bọolụ bụ nke ndị mba ọzọ na-eso rue ugbua.
  • Morley nwụrụ n'afọ 1924, mba Ịngland na-akpọ ya 'Nna mụrụ egwuregwu bọọlụ ọgbaraọhụụ.'
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ