SAFA ga-eme ntụlịaka na Maachị

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-achị egwuregwu bọọlụ na mba ụwa akpọrọ FIFA na bekee ekwuola na ha na ndị South Africa Football Association SAFA enweela nkwekọrịta gbasara ntụlịaka nke otu ha.
FIFA kwuru na SAFA ga-enwe ntụlịaka ọhụrụ n'ụbọchị iri abụọ na anọ n'ime ọnwa Maachị.
Onye isi ndị otu egwuregwu bọọlụ na mpaghara ndida Afrika akpọrọ Council of Southern Africa Football Associations na bekee bụ Phillip Chiyangwa gwara ndị nta akụkọ na ha nwere nkwekọrịta na isi ụtụtụ taa.
Akụkọ kwuru na nsogbụ bidoro oge ụlọọrụ na-ahụ maka ntụlịaka nke otu ha kwuru na ntụlịaka a anaghị eme ọzọ.
Akụkọ kwukwara na SAFA na-akwadebe ị ga ụlọikpe maka okwu a.
Ihe a mere ka FIFA tinye aka maka ị dozie ya bụ okwu.
FIFA kwuru na komitee ntụlịaka ọhụrụ ga-ahụ maka ntụlịaka ga-eme n'ihu.







