Guaranty Trust Bank: Ihe mere e ji gbachie ụlọọrụ anyị
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Oyinade Ogunade bụ onyeisi ngalaba mgbasa ozi nke ụlọọrụ 'Guaranty Trust Bank' gwara BBC Igbo ihe mere ndị ụlọọrụ ụtụisi ji gbachie ụlọọrụ ha dị n'Enugwu.
O kwuru na ndị ụlọ ụtụisi ajụghị ha ese maka akwụkwọ ụtụisi ha gosiri na ha ejighị ụgwọ tupu ha agbachie ụlọọrụ ha ahụ.
O kwukwara na ha na-elebanye anya na ya bụ ihe ma marakwa ihe ha ga-eme maka ya n'ebe ndị ụtụisị nọ.
Akụkọ si n'akara Twitter @EnuguCoal_City kwuru na ndị ụlọọrụ ụtụisi dị n'Enugwu steeti gbachiri ụlọọrụ ndị GTB nakwa nke Sterling nọ na steeti ahụ maka ụgwọ ụtụisi ha ji gọọmentị ka ha natachara ikike ụlọikpe.
Mana mgbe BBC kpọrọ ndị ụlọọrụ ụtụisi nke dị n'Enugwu steeti ahụ n'ekwentị ịjụta ha gbasara mgbachi a ha mere, enweghị onye zara ekwentị ha.
Anyị ka ga na-akpọ ha ịnụta ihe ha nwere ikwu gbasara ya.








