Nigerian Senate: Kedu ka o si kwụrụ taa?

Ọfọ ndị sineti

Ebe foto si, Nigeria Senate/Twitter

Nkọwa foto, Ọfọ ndị sineti bụ ihe na-egosi ikike ndị sineti

Ihe ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa tinyere uche na ya bụ ịma ma ndị ụlọomeiwu aga alagachite ọrụ.

Ndị omeiwu nke ukwu na ogbo ha na nke nta gara ezumike ọnwa abụọ n'ụbọchị 24 nke ọnwa Juun, nke mere ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari na gọọmentị ya bido iti mkpụ na ya bụ ihe ga-emebiri ha ihe ha na-ahazi, ọkachasị nke metụtara ntuliaka nke afọ na-abịa.

N'agbanyeghị na onyeisiala na-arịọ ka ha laghachite ọrụ tinye ọnụ n'ego ndị Inec ji eme ntuliaka ahụ nakwa ego ọ chọrọ ka e tinye na bọjetị nke afọ a, ndị omeiwu ka nọkwa enwe anwụrị ezumike ha. Ụfọdụ n'ime ha agaala njem.

Onyeisiala na onweya nọ mba ofesi na aracha ezumike nke ya.

Taa, ebumnobi ọtụtu mmadu bụ na ndị ọmeiwu ga-ezukọ n'obi ha, rachaa mkpụrụ aka ma binye aka n'iwu, mana Okeke ahụghị azụ Azụka.

Ihe Igbo na-anụ bụ na ọ bụ ọgụ na mgba chere ụlọomiwu n'ihu.

Bukola Saraki

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Saraki hapụrụ APC laghachị PDP

Ndị nọ n'otu akụkụ bụ ndị otu pati na-achị bụ ndị Bekee kpọrọ All Progressives Congress (APC). Ndị kwụ n'akụku ọzọ bụ ndị Peoples Democratic Party (PDP) bụ ndị a chuturu n'ọchịchị n'afọ 2015.

Ndị PDP na-ebo ndị APC na ha na-akpa nkata etu ha ga-esi chụtuo onyeisi ndi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki.

Ndị APC adịghịkwanụ agọ ya bụ ebubo, makana onyeisioche ha bụ Adams Oshiomhole na-ekwusi ike na ya bụ nchụda ziri ezi, ma kwukwaa na Saraki kwesịrị ịkwanyere onweya ugwu rituo n'udo.

Saraki n'onweya kwuru na onweghi ebe o ji azụ aga.

Ọgbaghara mere n'ụlọomeiwu n'izu gara aga so n'ụmụ kepu kepu na-adapụta n'ịtụaka a.

Okwu ọbụzi ịma mbe n'abọ nke bụ oke?

PDP kwụsị ike na onweghị ebe Saraki na-aga ma ọ bụrụ na ọbụghị ihe ruru mmadụ 76 tinyere aka n'ịchutu ya.

APC enweghị ihe ruru mmadụ 76 n'ụlọomeiwu ukwu.

Ugbua, ọ bụzi ndị APC na-eti mkpụ na ewu na-achọ ịnọ n'ụdọ mụo nwa.

Ha sị na ndị PDP na-achọ ịba ndị otu ha ọgụ n'ụlọomeiwu.

Ụlọọrụ ndị Sineti Naịjiria

Ebe foto si, @NGRSenate

BBC Igbo gbara Ike Abonyi bụ onye ndụmọdụ mgbasaozi nke onyeisioche PDP bụ Uche Secondus ajụju ọnụ maka ihe a ndị APC kwuru.

Abonyi gwara BBC Igbo na a maghị PDP maka ịchọ okwu maọbụ ịlụ ọgụ.

"Ọ bụ ndị APC ka a ma maka mgbasa ozi asị. Ihe a ha kwuru bụ ihe Bekee na-akpọ propaganda," Abonyi kwuru.

N'aka APC, BBC Igbo jụrụ Joe Igbokwe bụ ọnụ na-ekwuru ndị APC na Legọs, ihe ọ hụrụ n'okwu ndị pati ya kwuru maka ịchutu Saraki.

Igbokwe sị na yabụ atụmatụ ga-adị ire makana ha nwere ikike ime ya.

"Ọbụghị eziokwu na anyị ga-enwe mmadụ 76. Ị ma na anaghị ezucha...e ruo 80, ndị ka ga-ewepụnwu Saraki," Igbokwe kwuru, ma tụọ ilu sị na onweghị ebe e si aga Ọnịcha ọ dị nso.

Akụkọ a ka dị n'ekwu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ