Inec: Anyị ga na-eke PVC rue ọnwa Feburuwarị 2019

Onyeisioche nke INEC n'Enugwu bụ Emeka Ononammadu ekwuola na ụlọọrụ ha ga na-eke kaadi e ji atụ vootu bụ PVC n'aha ịchafụ rue otu izuụka tupu a tụọ vootu n'afọ 2019.
Ya bụ onye Resident Electoral Commissioner kwuru n'ụbọchị Ọgọstụ 17 afọ a ka ha ga-akwụsị idebanye aha n'akwụkwọ.
Mana ndị debanyegoro aha ha nwere ike ịga na-ewere PVC rue Febụwarị afọ 2019.
Ononammadu kwuputara nke a mgbe ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'Enugwu.
Ọ kọwara na ụlọọrụ ya na-agagharị n'okpuru ọchịchị 17 dị n'Enugwu iji kpokue ndị mmadụ ma nyochaa ka ha sị edenye aha n'akwụkwọ.
Akụkọ pụtara na Inec ga-akwụsị inye kaadị PVC mana Inec akọwaala na ọ bụ idenya aha ka ha ga-akwụsi, na ọ bụghị ikesa kaadị PVC.
Nke a pụtara na onye ọbụla edebenyeghị aha rue ụbọchị Ọgọstụ 17, agaghị edebanyelizi aha ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:





