You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Atọrọla mmadụ 80 n'ụzọ Birnin Gwari na Kaduna Steeti'
Akụkọ si Birnin Gwari nke dị na Kaduna Steeti na-akọwa na ndị obu egbe wakporo ndị na-agba n'okporoụzọ wee tọrọ mmadụ 80.
Ndị na-ahụ maka ndị na-arụ ọrụ ụgbọala bụ NURTW na-ekwu na ndị a bu egbe kwụsịrị ọtụtụ ụgbọala wee kpọrọ ndị nọ n'ime ha baa ime ọhịa.
Ndị bi ebe ihe a mere kwuru na ọ bụ ụbọchị ụka ka ihe a mere, ma kwukwa na ụgbọala ndị ihe a metụtara ka nọ ebe a hapụrụ ha.
Onwebeghị ihe ndị uweojii kwuru maka ihe mere.
Ozi si n'aka ndị NURTW na-akọwa na ndị ntọ a ebidola ịkpọ ndị nwe ndị a atọorọ, ịnata ha ego ha ga-eji gbapụta ha.
Ndị isi ndịagha Naịjirịa gara ebe ahụ ụnyaahụ maka mwakpo ndị obu egbe na-eme ebe ahụ.
Ntọrọ mmadụ na-eme na mpaghara Naịjirịa ihe a mere, mana ndị nke a metụtara karịrị ka ọ na-adị na mbụ.
Akụkọ ọzọ ga-amasị gị: