Agbaala ụlọọrụ APC dị n'Imo ọkụ

Ụmụ agboro a na amaghị aha gbara ụlọọrụ APC dị n'imo steeti ọkụ.

Onweghị ndị mmenyụ ọkụ bịara mmenyụọ ọkụ a.

Ọkụ a gbaranụ mebiri ọtụtụ ihe dịka ngwaọrụ nakwa akwụkwọ dimkpa nke bekee kpọrọ 'document'.

Onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ APC n'Imo steeti bụ Hilary Eke, kwuru na mkpamkpa a bụ akaọrụ ndị omekome chọrọ imebi ọgbako nke okpuru ọchịchị kwesịrị ime taa.

Eke ṅụrụ iyi sị na a ga-emerịrị ya bụ ọgbakọ nke okpuru ọchịchị makana nke e mere n'izuụka gara nkeọma.

Ọ rịọrọ ndị na-emerighị na nke gara aga ka ha kwe ka udo chịa.

N'ọnụ ya, "ọgbakọ agaghị eme n'ụlọọrụ APC mana ọ ga-eme n'okpuru ọchị ruru 27 n'ọnụ ọgụgụ."

"Ọrụ m bụ ikpesara ndị uweojii ka ha nyochaa ma chọpụta ndị kpara mkpamkpa a."

Akụkọ ga-amasị gị: