You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọọrụ EFCC awakpola Club 57 dị na Ikoyi
Aka akparala ndị akpọrọ ụmụnwoke yahoo yahoo ruru iri na abụọ ka ndị ụlọọrụ na-ahụ maka mmerụaka wakpochara klọbụ dị na Legọsị.
Ndị ụlọọrụ EFCC natakwara ụgbọala iri na ya bụ mwakpo.
O ruru elekere atọ ha jiri mee mwakpo a.
Ebe ụfọdụ n'ime ndị a hapụrụ ụgbọala iri ha "na-acha n'anya" gbalaga, ụfọdụ gbaara isi akwara.
Anyi nwetere akụkọ a site n'igwe ọkwu twita ndị ụlọọrụ EFCC taa.
Ndị ụlọọrụ EFCC nwuchiri mmadụ iri na abụọ ma natakwa ụgbọala iri.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu n'igwe twita maka ya:
Temu Bobbii kwuru na enwere ọtụtụ ndị ụmụ nwoke bị na Legọsị enweghị ezigbo aka ọrụ karia ma ị na-akpụgharị ụmụnwaanyị n'ụlọ nkwụ
Mana Ceeboss jụrụ ma ọ bụ arụ ịbụ ọgaranya?
@MikelJohn679 kwuru,EFCC aghọla ndị uweoji.Kedụ maka ndị gọọmenti na-eme mmerụaka izu akụ na ụba Naịjirịa? Ọrụ adịghị.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: