You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ọgwụ ọhụrụ nwereike ị gwo Ebola na mba Congo
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Otu onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo kpokobara na-abụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị abanyela ya bụ ndọrọndọrọ n'ezie.
Otu ahụ akpọrọ 'Coalition for African movement' malitere ikwado otu pati African Democratic Congress ADC n'aha ịchafụ.
Ogwu Ebola
Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mba Congo ewuputala na ha ga eji ọgwụ ọhụrụ ha nabatara n'afọ gara aga iji gwọ ọrị Ebola malitere na bee ha.
Ha kwuru nke a ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ gbagoro ruo iri n'abụọ.
Ebe ọzọ n'Afrịka,
Otu ụlọịkpe na mba Sudan amaala otụ nwaagboghọ ịkpe ọnwụ maka na o gburu dị n'ihi mwakpo dị ya wakporo ya ebe ụmụ nwanne dị ya jichiri ya n'ala.
Okaịkpe n'obodo Omdurman mara ya ịkpe a ebe ezinaụlọ dị ya jụrụ ị nara ịkpe ọzọ n'abụghị nke gaewere ndụ nwaagboghọ ahụ.
N'Egwuregwu.
Mohammed Salah ritere ntuliugo abụọ bụ Player of the Season kachasi bụ n'emume ntuliugo otu egwuregwu bọọlụ Liverpool mere n'abali ụnya ahụ.
Salah kwuru na ọdịnihụ ya ka siri ike na Liverpool ebe ọrụ ya ka na-ebido ebido.
Ihe ọzọ ị kwesiri ị maa:
Ụlọikpe etiti n'Abuja ụnyaahụ kagburu nkwụsị ọrụ ndị sineti mere sinetọ Ovie Omo-Agege rue mkpụrụ ụbọchị 90.
Mana obi adịghị ndị sineti mma maka ikpe a ya mere ha ji achọ ime mkpesa ikpe ahụ.
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a: