You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Twitter enwurula ọkụ maka okwu ndị 'Yahoo'
Akụkọ na EFCC nwụchiri ndị Yahoo 12, ebulitela ndọrịtaụka maka ndị a ji aghụghọ anara mmadụ ego ya na soshal midia.
Ụbọchị Satọde, aka kparala ụmụnwoke 12 ji aghụghọ anara mmadụ ego ha a na-akpọ 'Yahoo-Yahoo' n'ụlọ oriri na nkwari dị na Legọs.
Ndị ụlọọrụ EFCC natakwara ha ụgbọala iri oge ha wakporo ha dịka ụfọdụ n'ime ndị a hapụrụ ụgbọala iri ha "na-acha n'anya" gbalaga.
Mana dịka ọtụtụ ndị Naijiria na-akatọ agwa ndị Yahoo-Yahoo ma kwuo na ọ bụ ifee ego kpatara 'Yahoo-Yahoo' na mmerụaka ji arị elu na Naijiria, ebe ụfọdụ kwuru na ọ bụ ọnọdụ Naijiria butere ajọ agwa a.
Otu onye kpọrọ onwe ya Ohimai Godwin Amaize, kwuru na Twitter na "Ebe ọ bụrụhaala na ịda ogbenye dịka mpụ na Naịjirịa, ebe ọ bụ na a na-akparị mmadụ maka na ọ bụ onye ogbenye, ma na akatọ ya, "O buru na inweghị ego, ga-zo ihu gi, anyị na akpa ọchị ikwu na anyị chọrọ ikwụsị Yahoo-Yahoo na mmerụka!"
Onye ọzọ nyere aha ya dịka Mandem, tụrụ arịrị na ugboro ugboro ya na ndị mba ofesi na-akpa nkata azụmahịa ma "ngwangwa ha chọpụtara na m bụ onye Naijiria, ha agbanyụọ ọkụ n'ihi ndị a a kpọrọ Yahoo-Yahoo."
Demola kwuru," A zụrụ m laptọp, gị azụọ. A zụrụ m modem, gị azụọ, E goro m internet, gị egoo. M'abụrụ onye ji ihe ndịa na emepụta ihe, gị nwa e jiri nke gị ghọọ nwoke Yahoo. Ihụla na ọ bụghị Naijiria butere ya. Ọ bụ ihe ị chọrọ ka ị hụrụ. I bụ onye ohi."
Mana ihe kara mee ka Twitter nwuru ọkụ bụ okwu Noble Igwe kwuru na Twitter ebe ọ katọrọ ndị Yahoo ma kwuo na ọtụtụ ụlọ oriri dị na Victoria Island bụ ebe ndị Yahoo na-agbakọ.
Okwu ya kpara otu onye a kpọrọ Oyemyyke iwe nke mere o ji mee ihe nkiri na-akpọrị Noble Igwe.
Lee ihe ndị ọzọ kwuru maka okwu a kpụ n'ọnụ:
Miss poetic kwuru na ya ghọtara na ndị Yahoo bụ ndị ohi ndị a chọghị ịgba mbọ, kama ha na-agbawa ndị mmadụ aka ma na-emebi aha ndị Naijiria na-akwụwa aka ha ọtọ, mana ya aghọtaghị ndị na adọnyere ha ukwu sị na ọ bụ ihe kpatara ha ji etinye aka n'ihe ọjọọ a.
Dịka ụfọdụ na-akatọ ndị oji aghụghọ a nara mmadụ ego ya, ụfọdụ na-ekwuchitere ha sị na ọ bụ ọnọdụ mere azụ mgbakọ.
Good Civillan Emose kwuru na ọ bụ ndị ajọ ndị ndu kwanyere ha n'ọnọdụ ahụ.
Ụfọdụ kwuru na ndị Yahoo ji ego ha nwetara atọ mkpa.
Akụkọ ọzọ ga-amasị gị: