You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala Buhari kwuru na ọ bụ naanị nyocha ahụ ka ọ gara
Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari kwuru na ahụ siri ya ike, na ọ bụ naanị nyocha ahụ ka ọ gara ime na UK.
Ka ụgbọelu bu ya fedatara n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikwe n'Abụja n'elekere asaa nke abalị, ndị ọrụ ya na ụfọdụ ndị ntaakụkọ zutere ya.
Otu onye ntaakụkọ jụrụ ihe kpatara o ji bata otu ụbọchị tupu oge o kwuru na ọ ga-alọta (nke bụ ụbọchị satọdee).
Buhari zara ya sị "Ọ bụghị tupu oge a tụrụ anya. Naanị nyocha ahụ ka m gara mana ahụ siri m ike, daalụ."
Buhari gara njem n'ala Briten n'ụbọchị tuusde ebe ọ gara ịza oku dọkịta ya kpọrọ ya.
Ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Garba Shehu bụ onye dere ya na Twitter.
Cheta na Buhari nọrọ ihe ruru ọnwa anọ na Briten n'afọ 2017.
Njem nke a o mere n'izu a kpalitere ajụjụ ndị mmadụ chọrọ ịmata ma ahụ o siri ya ike isonye na ndọrọndọrọ ọchịchị nke a ga-eme n'ọnwa Febụwarị 2019.
Akụkọ ga-amasị gị: