You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Egbuola mmadụ ma gba ụlọ ọkụ n'ogbaghara na Kaduna
Akụkọ site na Kaduna Steeti na-akọwa n'ihe ruru mmadụ ise anwụọla n'ogbaghara diri n'etiti ndị ụka Kraist na ndị alakọba na gburugburu ebe a na-akpọ Kasuwan Magani, nke dị n'okpuru Kajuru 'Local Government Area'.
Agbakwala ụfọdụ ụlọ epere na ụlo obibi ọkụ ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ n'ọgbaaghara a.
Ndị mmadụ ka na-alụ uka etu ọgbaghara a siri bido, mana otu akụkọ sịrị na-obidoro mgbe ndị okoroọbia n'ime ndị na-epe ụka Kraist na Kasuwan tiri umụnwaanyị ha ihe maka ha sị na ha na ndị okoroọbịa alakoba na-aghị ọghị, akụkọ ọzọ kwuru n'ọgbaghara a bidoro mgbe asiri gbasara na ndị alakọba n'obobo ahụ achọrọ iji ike me ka ụmụnwaanyị ndị ụka Kraist kpebe Alakọba.
Mana, akụkọ ọzọ na-akọwa n'akpọmashị dị n'etiti ndị okwukwe abụọ a na Kasuwan Magani na mbụ tupu ọ bịa n'isi n'ụtụtụ ụnyahu bụ Monde.
Kasuwan Magani dị n'ụzọ esi aga Plateau, Nasarawa na Benue Steeti, nakwa ndịda Kaduna Steeti bụ mpaghara steeti ahu ndị uka Kraist kachasị.
Ndị si ụzọ ahu agafe tọọrọ ka ọgbahara a na-eme.
Aliyu Mukhtar bụ onyeisi ndị uweojii na Kaduna gwara ndị ntaakụkọ na ndị ọrụ ha gbochiri ogbaghara ahụ ma hụkwa na onweghi nsọbụ dị na Kasuwan Magani ọzọ.
O kwuru na ya zipuru onyeisi uweojiii na-ahụ maka ọrụ nchekwa ka ọ ga ebe ihe na-eme ma hụ na orughị ebe ọzọ na steeti ahụ.
"Anyị wetara ozi na nsogbu di na Kasuwa Magani n'utụtụ a. Onye na-ahu maka ọrụ nchekwa n'ụlọọrụ anyi no ebe ahu ugbua. Ndị Mopol nọkwa ya. Ha ncha hụrụ na nsọgbu ọbụla adịghịzi na Kasuwan Magani," Mukhtar kwuru.
Ọ gara n'iru kwuo na ya enweghi ike ikwu ihe bụtere okwu n'ebe ahụ ma ya bụrụ na ndị uweojii emechaghị nchọpụta.
Onye na-achị Kaduna steeti nụ Mazi Nasir el Rufai si ka-ejiri ọsọ ọsọ jide ndị niile aka ha dị n'ogbaghara a. Samuel Aruwan, bu onye na-ekwuchịtere el Rufai, si na ka ọ na-asị ndi ihe a metutara ndo, ọ gwakara ndị ọrụ gbata gbata na Kaduna Steeti ka ha ga-nyere ndị chọrọ enyemaka aka ozugbo.
BBC Igbo kpọrọ Emeka Okeiyi bụ onye be ya dị nso n'ebe ihe mere n'ụtụtụ a ka anyi mata etu obodo ahụ dị ugbua.
Mazi Okeiyi gwara BBC Igbo na Kaduna dị oyi, na-onweghi nsogbu ọbula dị. Ọsịkwa n'ọgbaghara ụnyahụ abaghị n'ime Kaduna kpomkwem, mana ha nụrụ maka ya n'ehihe mgbe ọgọ ya nwaanyị kpọrọ ha gwa ha n'ahịa Kasuwa Magani enwụrụla ọkụ.
Kaduna Steeti so na steeti dị n'ugwu Naịjirịa ebe oghaghara n'etiti ndị uka alakọba na ndị ụka Kraist na-eme kwamgbe kwamgbe.
Ọgbaghara nke mere n'afọ 2000 gburu mmadu ruru puku ma me ka-ekewa obodo Kaduna abụọ ka ndị ụka Kraist birizi na ndịda Kaduna, ka ndị ụka Alakọba biri na ugwu ya.