Ụmụigbo nọ UK alụọla ọgụ maka onye nna ya ka nwe ego

Ikpe nkwụmọtọ

Ebe foto si, Uche Akolisa

Nkọwa foto, Nwata a kwọ n'azụ ọ ma na ije dị ụfụ?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Elvis Ilonze, onye nwechara ego nke na ọ na-agba ụgbọala Mercedes nke e ji ajị anụ gbuchie ahụ ya wakporo enyi ya ya na ya tookọrọ bụ Prince Nnaji n'ebe obibi ha dị na Brighton na mba Briten.

Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Sun nke Lọndọn siri kọwa, Elvis Ilonze onye dị afọ iri abụọ na otu (21) kụrụ enyi ya akụ akụ n'ihi ndọrịtaụka onye ka nna ya kachasị nwe ego.

Okwu aghọọla okwu ịkpa ọchị na soshal media.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ilonze nakwa enyi ya ọzọ a kpọrọ Daniel Oluyemi nke dị afọ iri abụọ na anọ chụkwudoro Nnaji ebe ọ na-agba ọsọ igafu jiri karama kụọkwa ya ihe.

Ha lusokwara nwa Igbo ọzọ bụ Chiedozie Dibiagwu, dịka ọ nọ na oche dị nso ebe ihe mere, ma kwada enyinwaanyị Nnaji bụ Louanna Rayawa n'ala.

A kara ịtụba Ilonze na Oluyemi na nga ka ha kwetachara na ha merụrụ mmadụ ahụ mana ahapụrụ rue ọnwa iri na asatọ ihe mere na ụbọchị nke asaa nke ọnwa Eprelụ.

A kwara ụlọikpe na Ilonze na Nnaji si na Naijiria mara onwe ha mana Ilonze kpebiri 'ịkụziri' enyi ya ihe ka o kwuchara na nna ya ka nke ya nwe ego.

Ilonze, onye bụ nwa ọgaranya bịara Briten ịgụ akwụkwọ afọ anọ Ịjinịa na mahadụm, University of Sussex, ebe o nwere otu afọ ka ọ gụcha, ebe Oluyemi na-agụ maka ịbụ onye ngụkọ ego(accountant).

Okaiwu Ilonze bụ Tom Hoskins rịrọ ọkaiwu ka ọghara ịtụ ya mkpọrọ karịa otu afọ n'ihhi na ọ ga-eme ka a tulata ya Naijiria n'ike.

Presentational grey line

Akụkọ ndị ga-amasị gị: