Akụkọ kachasị n'abalị a: Ogbuagu sị sonye na ntuliaka
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Uche Ogbuagu rịorịọ Igbo ka ha ga gbata akwụkwọ ntụliaka

Dike Igbo ama ama na-ịkpa ụka ọchị bụ Uche Ogbuagu arịọla ụmụ ntotobịa Igbo ka ha ga gbata akwụkwọ ikike eji eme ntuliaka ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ọgbuagụ rịorịọ arịrịọ a mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka ụnyahụ n'obị ya n'Ikeduru, Imo Steeti bụ ebe ọnọrọ riọ ụmụ ntọrọbịa ka ha ghara iji akpịrị ego refuo ikike ha nwere iji weta mgbanwe tọrọatọ n'ndụ ha.
Ọdachị daara ndị otu CAN

Ebe foto si, CAN/Twitter
Ode akwụkwọ otu jikọtara ndị otu kristi na Naịjirịa akpọrọ CAN n'aha ịchafụ bụ Rev. Musa Asake alala mmụọ ka ọrịachara ọbere ọrịa.
Onyeisi mgbasa ọzị ndị otu a bụ Pastọ Adebayo Oladeji gwara ndị nta akụkọ nke a mgbe ya na ha nwere mkparịta ụka.
Iran akwadola mba Syria ka Izrelu tụchara ha ogbunigwe

Ebe foto si, Reuters
Mba Iran akwadola ndị Syrịa dika mba nwere ikike ịkwuru onwe.
Iran kwuru nke a ka Izrelu tụchara ogbunigwe na ihe ha hutara dika ka ọdọ ndị agha ndị Iran dị na Syria ma katọkwa ụma Izrelu mere.
N'egwuregwu
UEFA eriela Gianluigi Buffon iwu

Ebe foto si, EPA
N'egwuruegwu, otu UEFA amala Gianluigi Buffon nke Juventus Ikpe ka ọkparịchara onye ogbu opi na asọmpị ha na Real madrid.
Nke a mere ka ogbu opi ahụ nyechere ndị Real Madrid penariti dịka ọfọrọ tinkọm tinkọm ole ka egwu bọlụ ahụ bie.
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Ị mara ihe ọfọ bụ n'ala Igbo?












