Nwoke anarala ụtarị ruru 80 maka ịkpọ nwaanyị akwụna

Nwoke a na-apia ihe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iwu sharia na-abụkarị isiokwu ndọrọndọrọ n'etti ndị alakụba omenala na ndị mgbanwe ihe.

Ụlọikpe nọ na Magajin Gari dị na Kaduna nyere ka Shuaibu Umar nara mpiampia ụtarị 80 maka na ọ kpọrọ nwunye nwanne ya bụ Suwaibu Abdulkadir onye akwuna.

Abdulkadir onye kpopụrụ nwanne di ya n'ulọikpe maka mmetọ aha gwara ụlọikpe na Umar kpọrọ ya akwụna maka nghọtaghie ha nwere.

N'okwu Abdulkardir, "Achọrọm ka ụlọikpe a nye m ikpe kwụ ọtọ gbasara ajọ aha Shuaibu kpọrọm."

Shuaibu agọnahụghị ebubo a kama o kwuru na ọ kpọrọ Abdulkadir akwụna n'iwe nakwa o nweghị nwute.

N'okwu Shuaibu, "Obi gbawara m mgbe ọ kporọ m onye ọgwụ na onye ohi."

Onye ọkaiwu ukwu bụ Mallam Dahiru Lawal kpebiri ka a pịa Umar ụtarụ ruru 80 ka o nyechara ya ohere ị weghachị okwu ọjọ ahụ.

N'okwu onye ọkaikpe ahụ, ''Ikpe a sonyere nkuzi onye amụma Mohammadu nke kwuru na mmadụ e nweghị ike ibo onye ọzọ ebubo mpụ ma ọ bụrụ na enweghị mmadụ anọ hụrụ ka onye ahụ na-eme mpụ."

Presentational grey line

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Presentational grey line