Naomi Osaka apịapụla Serena Williams na semi-final Australian Open 2021

Ebe foto si, Getty Images
Naomi Osaka agbaarala Serena Williams ụgbọ nwa mkpi n'asọmpi Australian Open nke afọ 2021.
6-3 6-4 bụ ihe Naomi Osaka ji merie Serena Williams were tozuo oke iso n'asọmpi nke egbe buru ọ laa bụ nke ga-adị n'ụbọchị Satọde.
Mana asọmpi nke taa adịghị ka nke afọ 2018 oge Osaka na Williams zutere n'agba nke Ikpeazu iko US Open.
Osaka na Williams ji obi ọma bikọrịta onwe ha ọma oge asọmpi nke taa bịara n'isi njedebe.

Ebe foto si, Getty Images
Osaka merikwara Williams n'asọmpi ahụ, mana Williams na onye 'umpire' gburu ya bụ asọmpi nọ na-aba sọ mba, nke mere ka a taa Williams ahụhụ.
Williams mechara bo 'umpire' Carlos Ramos ebubo ịkpa oke n'asompị ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Lee ihe mere na US Open 2018
Serena Williams bụ onye mmeri a ma ama na mbaụwa n'egwuregwu tenis akatọọla onye gburu pịpịrọ n'asọmpi US Open ha pịara n'abalị itoolu nke ọnwa Sepụtemba afọ 2018
Nwa Japan dị afọ 20 bụ Naomi Osaka meriri Williams n'asọmpi ahụ nke mere Osaka jiri nweta nturuugo mbụ ya a na-akpọ Grand Slam Title.
Willaims boro ogbu pịpịrọ ahụ bụ Carlos Ramos ebubo ịkpa oke n'etiti nwoke na nwaanyị ebe o kwuru na nwoke ahụ kpasoro ya ajọ agwa karịa etu o si emeso ụmụnwoke.
Mana ogbu pịpịrọ ahụ kagburu egwu William maka na ọ dara ụzọ iwu atọ nke gụnyere, ịnta enyemaka n'aka onye nkuzi ya, ịgbaji akupe egwu ya nakwa ịkpọ Ramos onye ohi.
Mana agbanyeghi ntaramahụhụ ahụ e nyere, ọ gwakwara ndị ntaakụkọ na onye ogbu pịpịrọ ahụ anaghị akpaso umunwoke ụdị agwa ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
N'okwu ya; "Ahụla m umunwoke ebe ha na-akpọ ndị ogbu pịpịrọ ọtụtụ afọ, anọ m ebe a alụrụ ụmụnwaanyị ọgụ.
"Naanị maka na m kpọrọ ya onye ohi mere o ji nara m otu egwu m, ahụtara m ya dịka ịkpa oke n'etiti agwa nwoke na nwanyị.
"Ọ natabeghi nwoke egwu na mbụ maka na ọ kpọrọ ya onye ohi."
Egwuregwu ahụ na-ewu ewu n'elu soshal midia maka na ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwwaanyị is ojii na-ahụa ihe mere dịka mmegbu na ịkpa oke megide ha.
Victoria Azarenka kwuru n'ezie, ọ bụrụ egwu ụmụnwoke, ihe hụ mere agaghị eme.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana Umar kwuru na ọ bụụ̀hị eziokwu, na etu Williams si kpaa agwa adịghị mma nke mere o ji nweta ntaramahụhụ kwesiri ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'ihe niile, nke a bụ mbụ onye Japan na-enweta mmeri 'Grand Slam Title' nke Naomi Osaka dị afọ 20 nwetara dịka o meriri Serena n'asọmpi ahụ.










