Serena Williams chọrọ ibido asompi ụmụnwaanyị n'Afịrịka

Serena Williams

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Williams kwụsịrị ịsọmpi n'ọnwa isii gara aga ịga mụọ nwa

Serena Williams, bụ onye mba ụwa ma ama n'egwuregwu tenis, ewepụtala atụmatụ na mkpali o nwere ibido asọmpị mba ụwa n'egwuregwu tenis maka ụmụnwaanyị n'Afịrịka.

Ọ bụrụ na ọ gaa nkeọma, nke a ga-abụ bụ na mpaghara Afịrịka.

Ọ gwara BBC Sports na ọ bụ ihe dị ya n'uche.

N'okwu ya; "Ọ bụ ihe dị m n'obi, echekwala m ya ma a ga m aga n'ihu na-echkwa ya. Ọ na enye m obi aṅụrị maka na a na m eche na ọ ga-abụ ezi ihe ga-atọkwa ụtọ nke ukwu ebe ndị egwuregwu ga-esi na ya pụta site na mpaghara Afịrịka ga-adị nnukwu".

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Asọmpi ahụ a na-akpọ WTA n'aha ịchafụ bụ nke ndị ọkacha mara n'egwuregwu tenis na-eme, ndị na-ekpokoba ya bụ otu Women's Tennis Association (WTA).

Williams kwuru na ya ga-achọ ka asọmpi ahụ mee na mba Kenya dịka o kwuru na Kenya bụ otu ebe na-amasị ya ịga nke ukwu.

O kwuru na ya ga-akwado ịlaghachi ngagharị WTA n'ọnwa isii gafee ka ya mụsịrị nwa.

Williams a tụrụla ugo tenis a kpọrọ Grand Slam Singles ugbo 23.