Serena Williams chọrọ ibido asompi ụmụnwaanyị n'Afịrịka

Ebe foto si, AFP
Serena Williams, bụ onye mba ụwa ma ama n'egwuregwu tenis, ewepụtala atụmatụ na mkpali o nwere ibido asọmpị mba ụwa n'egwuregwu tenis maka ụmụnwaanyị n'Afịrịka.
Ọ bụrụ na ọ gaa nkeọma, nke a ga-abụ bụ na mpaghara Afịrịka.
Ọ gwara BBC Sports na ọ bụ ihe dị ya n'uche.
N'okwu ya; "Ọ bụ ihe dị m n'obi, echekwala m ya ma a ga m aga n'ihu na-echkwa ya. Ọ na enye m obi aṅụrị maka na a na m eche na ọ ga-abụ ezi ihe ga-atọkwa ụtọ nke ukwu ebe ndị egwuregwu ga-esi na ya pụta site na mpaghara Afịrịka ga-adị nnukwu".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Asọmpi ahụ a na-akpọ WTA n'aha ịchafụ bụ nke ndị ọkacha mara n'egwuregwu tenis na-eme, ndị na-ekpokoba ya bụ otu Women's Tennis Association (WTA).
Williams kwuru na ya ga-achọ ka asọmpi ahụ mee na mba Kenya dịka o kwuru na Kenya bụ otu ebe na-amasị ya ịga nke ukwu.
O kwuru na ya ga-akwado ịlaghachi ngagharị WTA n'ọnwa isii gafee ka ya mụsịrị nwa.
Williams a tụrụla ugo tenis a kpọrọ Grand Slam Singles ugbo 23.










