You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị uweojii anwụchiela onye ohi zuru n'ọdọọgwụ
Ndị uweojii nọ n'Enugwu steeti ekwuola na aka ha akparala onye a na-ebo ebubo na ọ bụ oji egbe ezu.
Ha nwụchiri nwa amadị a kpọrọ Okwudili Okechukwu, onye Umuleri dị na Anambara steeti maka iji egbe wakpo ma zuo ohi n'ebe a na-ere ọgwụ dị n'ụzọ University of Nigeria Teaching Hospital n'Enugwu.
Ebe ha zuru ọtụtụ ihe gụnyere igwe kọmputa nke a na-ebu n'aka, ekwenti nakwa ego pụtara puku narị naira abụọ, ịrị atọ na anọ(N234,000).
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu bụ Ebere Amaraizu, gwara BBC na ihe ahụ mere n'ezie.
O kwuru na Okechukwu na ndị otu ndị a ka na-achọ achọ iji wakporo ọdọ ngwa ọgwụ(pharmacy) zuo ọtụtụ ihe gụnyere laptọp, ekwentị na ego.
Ọ kọwara na ọ bụ ndị uweojii nọ n'ogige 'Central Police Station', Enugwu ndị zara mbeku ndị ihe metụtara nwụchiri Okechukwu, ebe ndị otu ya gbalagara.
Ọ gara n'ihu kwuo na e nwetara ihe ndị ha zuru nakwa na Okechukwu "na-enyere anyị aka ime nyocha ihe mere".