You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Ọtụtụ mmadụ kọrọ m ọnụ maka nwa' - Nne ejima atọ
Nwaanyị mụrụ nwa ka ọchọchara nwa afọ iri na itoolu ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ kọrọ ya ọnụ nwa.
Ogechi Odunze, nwunye ụkọchukwu a ma ama bụ Don Odunze (Jnr) ritere ejima atọ na nsonso a.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Ogechi kwuru na ndị mmadụ mere ya akaje n'ihi amụtaghị nwa.
"Ọtụtụ ndị mmadụ kọrọ m ọnụ nwa. Ma ndị kpọrọ onwe ha ndị enyị m sị m na ọ bụghị itu fashọn ka m ga-eji mụta nwa.
Oriaku Odunze kwuru na ọtụtụ ndị ụkọchụkwụ gwakwara ya okwu ọjọọ.
N'ọnụ ya, "Ha sịrị m bịa ka ha gbanye m holi sidi (holy seed) n'ahụ.
"Agwara m ha sị, 'Tụfịakwa! Na ọ bụghị mụ na ha. Na holi sidi di m na enyeghị esighị n'aka Chukwu were bịa.
"Aha m bụ Ogechi mana o nwere oge o ruru, m gwa di m ya akpozila m Ogechi na ọ dịka aha m akpatara ihe na-eme m jị eme m."
Oriakụ Odunze kọwara na ime pụrụ ya ugboro atọ: ime ejima atọ; ime ejima abụọ nakwa ime otu.
"A dịla m ime ejima atọ pụrụ, abụọ pụọ, na otu kwa. Mụ na dị m na-ekpere ndị na-achọ nwa ekpere, ha amụta nwa.
"Akaebe na-eju n'ụlọụka anyị kwa mgbe. Anyị were na-ajụ Chukwu keɗụ oge Ọ ga-enye anyị nwa nke anƴị.
Mana egwu mechara tụgharịala di na nwunye a," Ogechi Udunze kwuru.
Akụkọ ga-amasị gị