You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị mere ụmụnwaanyị Afrịka ji eghe ntutu ha eghe?
Otu ihe onye mba ofesi kwuru oge ọ hụrụ ntutu otu nwaanyị mba Naịjirịa bụ na ọ dị ogbo.
O kwuru nke a maka na ọ dịghị fịrị fịrị ka nke a ha, ntutu ụmụnwaanyị Afịrịka na-esi ike, juo eju, nwee ume ma rịgọọ arịgọ n'ụdị nke ya.
Ọ naghị anwụla anwụla etu nke ndị mba dị na Yurop maọbụ Amerịka si adị.
Mana ọ dị ka ụmụnwaanyị Afrịka aka hụ ntutu nke ndị ọcha n'anya karịa ụdị nke Chukwu nyere ha.
Nke a bụ maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị Afrịka na-eji akụrụngwa dị iche iche a na-akpọ 'Relaxer' na Bekee wee na-ete n'isi ha ka o were gbatịa dị ka nke ndị ọcha.
Ọtụtụ ndị mmadụ ajụọla ihe kpatara ha jiri hapụ ọmarịcha ntutu Chukwu nyere ha jiri akụrụngwa kemịkal na-ete na ya.
Ha jirichaa kemịkaal ahụ, ha arịgọọ ya ka ọ gbatịa dịka nke ndị ọcha.
BBC Igbo gbara ụfọdụ ụmụnwaanyị ndị na-eghe ntutu ha eghe ka ha kwuo ihe kpatara ha ji eme ya, lee ihe ha kwuru;
Ihe mere anyị ji eghe ntutu anyị eghe
- Ọ na-aka ama mma ma e gheesịa ya eghe: Ha kwuru na ntutu ha na-aka enwuke enwuke ma e jiri kemikaal ghee ya. Nke a bu maka na ha kwuru na ntutu ndị Afrịka na-adị ka ihe churu echu
- Ọ na anwụla anwụla dị mfe ijikọ: Otu ihe e ji eghe isi bụ na e ghesịa ya, ọ nwụlaa, ọ gaghịzị adị ike etu Chukwu si kee ya nke mere dịka ha si kwuo, ọ na-akara ha mfe ijikọ maa mee etu ọbụla ha chọrọ
- Ntutu anyị na-afụ ụfụ: Ụmụnwaanyị anyị gbara ajụjụọnụkwuru na ha anaghị etinyeli mvọ n'ime ntutu ha ma ọ bụrụ na ha eteghi ya ihe maka na o siri ike nke ukwu, mana kemikaal na-eme ya mfe ivọ
- Ọ na-adị mfe ịsa mmiri: Ha kwuru na ha nwaa anwa wụọ ntutu ha mmiri ma egheghi ya eghe, ọ na-adị ka ogbo, ọ naghị ekwe ọsịsa gụnyere na ọ na-eri mmiri ma na eri ncha. Ha kwuru na ha nwereike ịnọ elekere abụọ maọbụ atọ ebe ha na-asa isi mana ha ghee ya eghe, ọ naghị egbu oge
- Ịkpa isi anaghị arịa ahụ ma na aka anọ ọdụ: Ụmụnwaanyị a kwuru na ọ bụrụ na ha egheghi ntutu ha eghe, ha kpasịa isi, ọ naghị anọ ogologo oge, ọ kaa ma na ọ bụrụ na ha ghee ya eghe, ha ga-ebu otu isi ha kpara ma butee ya aka
- Maka na ndị ibe anyị ghere isi ha: Ụfọdụ n'ime ha kwuru na ọ bụ ndị mmadụ kwanyere ha n'ighe isi. Ha kwuru na oge ha bidoro, ọ bụ ndị ọyị ha kwanyere ha maka ndị ha hụrụ n'ihe onyonyo mere ka ọ bụ ighe ntutu ka mma.
Ihe ha kwuru nwereike inwe isi mana ụmụaanyị amakwa ụdị ihe e ji eme kemicaal ahụ ha na-awụnye n'isi na ihe ọ na-eme n'ahụ ha?
Ihe kemikaal 'relaxer' na-ebute
- Ndị na-eme nyocha kwuru na ụdị akụrụngwa siri ike e ji eme ya nwereike imeru ndị na-etinye ha n'isi ahụ
- Ndị na-eji ya bụ 'relaxer kwuru na ha chọpụtara na ntutu ha na-achagharị ma ha gaa n'ihu na-etinye ya ọtụtụ afọ
- Ọ na-eme ntutu adapụsịa: Agbanyeghi na ntutu ndị Afịrịka na-eju eju, kemịcaal 'relaxer' nwereike ime ntutu adapụsịa
- Ọ na-ericha ntutu site na ịgba ndị mmadụ ọkụ n'isi: Ụfọdụ ndị anyị gbara ajụjụọnụ kwuru na ụfọdụ oge, ntutu ha richara site n'ụdị 'Relaxer' ha tinyere maọbụ nke bara ha ọnya n'isi
- Nchọpụta a ka na-enyocha enyocha kwuru na ndị na'eghe isi ha oge ọbụla nwereike inwe akpụ ara kansa ọsịsọ karịa ndị na-adịghị eji ya.
Ọ bụ eziokwu na ntutu ndị Afịrịka siri ike ma na ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ụzọ iji mee ka ọ dị mfe ivo ka ụmụnwaanyị Afịrịka ghara itinye onwe ha na nsogbu site n'ịghe ntutu ha.