$1bn loan from China: Ụgwọ Naijirịa ji ga-ezu steeti ọwụwa anyanwụ afọ 28

Uju Paulcy

Ebe foto si, Uju Paulcy

Nkọwa foto, Uju Paulcy bụ onye ịchụ ntaego dooro anya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọọmenti etiti etinyela aka n'akwụkwọ maka ibite ego ruru otu ijeri dọla ($1bn) ha sị na a ga-etinye n'ọrụ obiọkụ Gurara Dam.

Nke a mere ka ndị mmadụ buru aka n'isi meghe ọnụ maka oke ụgwọ dị Naịjirịa n'isi ka ọ dị ugbua.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Ụlọọrụ Debt Management Office (DMO) gbara ama na ụgwọ dị Naịjrịa n'isi ugbua dị tarị naịra iri abụọ na anọ na ụma (N24.387tn).

Nke a pụtara bọjet 2019 Naịjirịa ugboro abụọ na ụma.

Onye ọrụ agụm ego doro anya bụ Malachi Ani sị "ụgwọ a Naịjrịa ji ga-ezuru steeti ọwụwa anyanwụ ihe ruru afọ 24 ma e nwere ego amapụtara maka mkpata na mmefu akụ ha nke 2019 bụ nke kariri N870bn maa atụ".

Onye ọrụ agụm ego

Ebe foto si, Malachi Ani

Nke a pụtara na $1bn gọọmenti chọrọ ibite ga-atụkwasa ihe n'elu ụkwọ Naịjirịa ji eji bụ nke ji ọkara chụwa ego bọjet ndị ọwụwa anyanwụ niile.

Agụnwaanyị ịchụnta ego doro anya bụ Uju paulcy kwuru na ọnweghị ihe dị njọ na-ibite ego.

Ego Naịjirịa na-ebite nwerike izuru ala Igbo afọ iri abụọ na anọ

Ebe foto si, Getty Images

Na isiokwu bụ itinye ya bụ ego na-ebe mkpa ọha na eze dị.

Ọ sị na "ọteela gọọmenti Naịjirịa biwere ego maka ọkụ latriki mana ọnwebeghị ihe ahụrụ anya".

Uju Paulcy

Ebe foto si, Uju Paulcy

Nkọwa foto, Uju Paulcy bụ onye ịchụ ntaego dooro anya

Uju na-arịọ gọọmentị ka ha kawa ahụ tinye ego nke a n'ọrụ ka ha siri kwuo, ịme ka ọkụ latriki bụrụ atrụrụ tawa na Naịjrịa.

Akụkọ ga-amasị gị