Anya anyị ga-acha ọbara n'ụbọchị Nov 6 - NLC

Nigeria Labour Congress ekwuola na ha ga-ebido abụbụ ọrụ n'ụbọchị Novemba 6, maọbụrụ na gọọmentị emeghị ihe gosiri na ha ga-akwụ ụgwọ nke kachasị ọbere ruru puku naira 30,000.

Ha kwuru na ọ bụrụ na ụbọchị a atụrụ aka ruo, ha ga-agba mbọ hụ na abụbụ ọrụ a ga-abụ nke kachasị ukwu na Naịjirịa.

Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-agba mbo hụ na o metutara gọọmentị n'ebe atụghị anya cha cha.

NLC kwuru na ha na-eme nke a makana gọọmentị adịghị eji anya ọma elekwasị ihe gbasara ndịọrụ na Naịjirịa.

N'ime akwụkwọ ọzị onyeisi ha bụ Ayuba Wabba zipuru, o dere na obi gbawara ha nke ukwu maka mkpebi "No Work No Pay" gọọmenti kpebiri ụbọchị ole na ole garaaga.

O kwuru na "Abụbọ ọrụa bụ makana anyị chọrọ ka gọọmentị ji anya ebere lee anyị bụ ndị ọrụ Naịjirịa"

"Ihe anyi chọkwa bụ ka gọọmentị mee mkpebi ọhụrụ ga-ekwu na akwụghị ụgwọ ọnwa ọbụla na Naịjirịa bụ inupuru isi n'iwu".

Ha na-ekwu na ọ bụ maka mkpebi a akpọrọ No Work No pay" bụ ihe mere a jiri kpebiri nke a.

Wabba dọ kwa ntị ndị gọvanọ dị iche iche na-ekwu na agaghị akwụ ụgwọ a achọrọ, ka ha cheta na ntuliaka 2019 na-abia, nakwa ka ha chefu na ndị ọrụ ga-ebinyeri ha aka mgbe ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị