You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kwụọ anyị ụgwọ afọ 11 Ị ji anyị - Ndị ọrụ Civil Defence
Ndị ọrụ 'Civil Defence' a na-akpọ 'Volunteer staff' karịrị mmadụ narị abụọ emeela ngagharị iwe na mpaghara ugwu Igboeze.
Ha kwuru na ego ụgwọ ọnwa e ji ha bụ ụgwọ ọnwa afọ iri na otu.
Ndị ọrụ ahụ yi uwe e ji mara 'Civil defence' gụnyere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị, kwara arịrị na ka mgbe e ji ha ụgwọ ọtụtụ n'ime ha anwụọla, ma kwukwaa na ha enweghikwa ego ha ji azụ ụmụaka ha.
Onye isi ndị otu ahụ bụ Maazị Mohammed Chukwudi Muktala, gwara BBC Igbo na ha bụ ndị mbụ malitere ọrụ 'Civil defence' n'afọ 1992.
Gọọmentị kwere ha nkwa ịkwụ ha puku naịra 30 (N30,000) kwa ọnwa mana kamgbe afọ iri na otu, ha ahụbeghị ego ọbụla anya.
Gọọmenti bidoro iwe ndị mmadụ n'ọrụ 'civil defence' ofụma n'afọ 1994, ma chefuo ha bụ ndị bidoro ọrụ dịka ndị ọrụ enyemaka nke Bekee kpọrọ 'volunteers'.
Mohammed na ndị ọzọ kwara arịrị na mmegbu a bụ naani n'ọwụwa-anyanwụ na south-south ka ọ dị n'ihi na ndị ọrụ enyemaka nọ n'Ugwu Awụsa abụrụla ndị aha ha dị n'akwụkwọ kemgbe 1994.
Thomas Uchechukwu na Oliver Eze kwara arịrị na ha eruola ogo ịla ezumike nka n'ọrụ mana ha amaghị ebe ha kwụ akwụ.
Ndị ọrụ enyemaka 'civil defence' ahụ nọ na-egosi na a zụrụ ha azụ na ya bụ ọrụ.
Ha nyekwara BBC ọtụtụ akwụkwọ ikike gosiri na ha bụ ndị gọọmentị ji arụ ọrụ mgbe ọbụla e nwere mmemme. Ha gosikwara akwụkwọ ha jiri wepu okwu ha na EFCC.
Ha nwere ụlọọrụ n'ime okpuru ochịchị mpaghara ugwu Igboeze n'Enugwu.
Mgbe anyị nọ na-ese ya bụ akụkọ ka otu nwoke a kpọrọ Samuel bụ onye sị na ọ bụ onye ọrụ DSS, bịara majaa onye ọrụ BBC sị ya anwala anwa see akụkọ maka ngagharị iwe a.
O dekwara akara ụgbọala anyị jiri bịa ya bụ njem.