Ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha apụtala n'ọgba Thailand

Ebe foto si, Thai Navy
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụmụaka iri na abụọ nakwa onye nchịkọta ha apụtala nime ọgba ahụ na mba Thailand.
Ndị ọrụ Navy Seal du ọrụ mgbapụta a, kwuru na a kpọpụtachaala ụmụaka 12 a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba kemgbe izu abụọ.
N'ihe ha dere na Facebook, ha kwuru sị "ụmụaka 12 a e ji 'wild boars' mara na onye nchịkọta ha apụtala n'ime ọgba. Ahụ zuru onye ọbụla oke. Hooyah."
A kpọpụtara ụmụaka asatọ ụnyaahụ, ma kpọpụta ụmụaka anọ, onye nchịkọta ha na otu dọkịta gara inyere ha aka taa.
Cheta na ụmụaka a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba ụbọchị Juun 23.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekeleela ndị nyere aka ịkpọpụta ụmụaka a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị otu Manchester United kwuru sị na ha chọrọ ka ụmụaka a na onye nchịkọta ha bịa n'ọgbọ egwuregwu ha ma ha gbakee.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post






