Thailand: Ihe onyonyo ọhụrụ egosila na ahụ siri ụmụaka ụmụnwoke ahụ ike

Aha onyonyo, Ị ga-ahụ ụmụntakịrị ahụ ebe ha na-agwa onye na-egwu mmiri aha ha

Ihe onyonyo ọhụrụ agbala nke gosiri ụmụaka ụmụnwoke mmadụ 12 nke otu ọgba bọọlụ Tayiland na onye nkuzi ha nọ n'ọgba mana ahụ siri ha ike.

Ọchụ juru ụfọsụ n'ime ha ọnụ dịka ha na-ekwupụta aha ha otu na otu.

A chọtara ha ụbọchị 2 Julai dịka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị itoolu a na-acho ma na ha dabara n'ime ọgba ebili mmiri dị ma na a na-ewegara nri na ọgwụ kamgbe ahụ.

Otu ihe bụ na mgbapụta ha nwereike iwe ọtụtụ ọnwa maka mmiri ahụ, ụzọ ihe abụọ bụ na e nwereike a kuziere ha etu e si egwu mmiri maọbụ e chere ka mmiri ahụ gbatuo.

Ihe nchegbu bụ na mmiri ka bidoro izo ya bụ na mmiri ga na-ebili karịa etu ọ dị ugbua.

Ihe onyonyo ndị agha mmiri Tayiland gosiri n'elu Facebook ahụ gosiri ka ụmụaka ahụ yi uwe nchekwa dị fịrịfịrị.

Otu n'ime ụmụaka ahụ kelere ndị ọrụ mgbapụta

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ụmụaka ahụ niile kwuru aha ha ma kelee ekele ndị Tayiland

Ụfọdụ ihe onyonyo ndị ọzọ gosiri na ụmụaka ahụ nwere ober ihe mmerụahụ nke ndị agha mmiri letara anya.

Ndị mgbapụta na ndị dọkịnta na nọs nonyere ha kamgbe a chọtara ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: