FIFA World Cup Qatar 2022: Tebụlụ asọmpi na mpụtara ha

Asọmpi egwuregwu bọọlụ Iko Mbaụwa nke ụmụnwoke bụ FIFA World Cup 2022 ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị Sọnde 20 Nọvemba 2022 ma kwụsị n'ụbọchị 18 Disemba 2022.

Nke a ga-abụ nke ugboro iri abụọ na abụọ a ga-agba asọmpi a kamgbe ọ malitere ma bụrụ nke mbụ a ga-agba ya na mba ndị Arab.

Mba iri atọ na abụọ ndị tozuruoke ga-awuchi na mba Qatar maka asọmpi a ga-akpụ ọkụ n'ọnụ.

Asọmpi a na-abụkaarị n'ọnwa Juun mana n'ihi oge okpomọkụ dị na mba Qatar, e buru ya bịawa n'ọnwa Nọvemba afọ 2022.